Take a fresh look at your lifestyle.

Osote Onyeisiala Shettima Nọrọ N’isi Ọgbakọ Nigeria Economic Council

Cyril Okonkwo dere ya na bekee

0 323

Nzukọ nke National Economic Council, NEC, amalitela na Council Chambers nke Presidential Villa, Abuja, ebe osote onyeisiala Kashim Shettima nọrọ n’isi ya.

Ndị Gọvanọ ndị bịara n’isi ụtụtụ maka nzukọ a nke malitere n’elekere iri na otu nke ụtụtụ, gụnyere Ademola Adeleke nke Osun steeti, Abdullahi Sule nke steeti Nassarawa, na osote aka na-achị steeti Enugwu bụ Ifeanyi Ossai.

Ndị ọzọ bịara bụ Gọvanọ Inuwa Yahaya, Gombe; Dauda Hassan, Zamfara; Dikko Radda, Katsina; Abdulrahman Abdulrazak, Kwara; Abia Steeti, Dr. Alex Otti; na Babajide Sanwo-Olu, Legos Steeti.

Gọvanọ ndị ọzọ bịara nzukọ a bụ ndị Bauchi, Bala Mohammed; Kaduna Uba Sani; Delta, Sheriff Obrevwori; Kebbi, Nasir Idris; Anambra, Charles Soludo; Edo, Godwin Obaseki; na osote Gọvanọ Kogi steeti, David Onoja.

Ndị gọvanọ steeti Jigawa, Umaru Namadi; Yobe Steeti, Mai Mala Bunu; Bayelsa, Duoye Diri; Akwa Ibom, Umo Eno; Cross River, Bassey Otu; Ogun Steeti, Dapo Abiodun; Sokoto Steeti, Ahmad Aliu; Plateau steeti, Caleb Mutfwang; Benue, Rev. Fr. Hyacinth Alia, Imo, Sinetọ Hope Uzodimma; na onye na-achị Ondo steeti bụ Lucky Aiyedatiwa.

National Economic Council bụ otu iwu kwadoro, nke osote onyeisiala chịkwara nke mejupụtara Gọvanọ iri atọ na isii nke Naijiria, ndị minista na-ahụ maka ego, Gọvanọ Central Bank of Nigeria, CBN, Group Chief Executive Officer of Nigeria National Petroleum Company Limited, NNPCL, na ndị ọzọ.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *