Take a fresh look at your lifestyle.

Onyeisiala Tinubu Alaghachila N’Abuja Ka Ọgbakọ AU Gachara

Timothy Choji dere ya na bekee

0 394

Onye isi ala Bola Tinubu alọghachila Naijiria ka ọ gachara nzukọ nhazi oge etiti nke ise nke Africa Union, AU.

Ọ rutere n’ọdụ ụgbọ elu Nnamdi Azikwe International Airport dị n’Abuja n’uhuruchi Mọnde.

Odeakwụkwọ gọọmentị etiti bụ George Akume bụ onye nabatara nwa amaala nke mbụ.

Ndị ọzọ bịakwara nabata onyeisiala bụ Gọvanọ Imo steeti bụ Hope Uzodinma, onye na-ahụ maka ndị uwe ojii bụ Kayode Egbetokun na onye bụbu Gọvanọ Kano steeti bụ Abdullahi Ganduje.

Na ọgbakọ AU e mere na mba Kenya, Onyeisiala Bola Tinubu kpọrọ oku ka ejikwaa ọchịchị onye kwuo uche ya n’Afrịka.

Ọ gwakwara ndị ogbo ya n’Afrịka ka ha kwado njikọ nke ịdị n’otu ha ma chebe obodo ha pụọ ​​n’agbụ nke mmegbu ndị mba ọzọ.

 

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *