Take a fresh look at your lifestyle.

Ndị Omebe Iwu Naijiria Ga-akwado Ndị Isi Ọrụ Nchekwa Ọhụrụ

Edwin Akwueh dere ya na bekee

0 306

Ndị omebe iwu Naijiria adịla njikere ugbu a inyochaa ma kwado ndị isi ọrụ nchekwa nke mba ahụ, na-agbaso arịrịọ Onyeisiala Tinubu na-achọ nkwado nke Ụlọ Nzukọ.

Arịrịọ nke Onyeisiala Tinubu dị n’akwụkwọ ozi o degaara onye isi oche Sineti, Godswill Akpabio ma gụọ na Tuuzde tupu ya abanye na mmemme ndị ọzọ nke ụbọchị ahụ.

Ndị isi ọrụ ọhụrụ a bụ Maj. Gen. Christopher Musa – Onye isi ndị ọrụ nchekwa, Maj. Gen. Tahoreed Lagbaja – onye isi ndị agha, Rear Admiral Emmanuel Ogalla – onye isi ndị ọrụ ụgbọ mmiri, Air Vice Marshal Halidu Abubakar – Onye isi ndị ọrụ ụgbọ elu, Kayode Egbetokun – onye na-ekwuchitere onye isi ndị uwe ojii na Maj Gen. E. P. A Undiandeye – Chief of Defence Intelligence.

Onye isi ala Tinubu nwere na Mọnde, June 19 kwadoro ịla ezumike nka ngwa ngwa nke ndị isi ọrụ niile, Inspector-General of Police, Advisers, na Comptroller-General of Customs Service ma mechaa họpụta ndị isi ọrụ ọhụrụ.

Ha nọchiri General Lucky Irabor -Chief of Defence Staff, Lt. Gen. Ibrahim Attahiru -Chief of Army Staff, Rear Admiral Awwal Gambo -Chief of Naval Staff, Air Vice Marshal Isiaka Amao -Chief of Air Staff, Usman Alkali Baba -Inspector General. nke ndị uwe ojii.

Nhọpụta ọhụrụ ahụ, dị ka Tinubu si kwuo bụ ndị kwekọrọ na ngalaba 18 (1) nke Iwu ndị agha. Iwu Cap A20 Federation of Nigeria 2004.

Atụmatụ nyocha na nkwenye nke ndị isi ọrụ site na Senate na Kọmitii dum, dị ka onye isi oche Senate kọwara si n’eziokwu ahụ bụ na a ka ga-emebe kọmitii na-eguzo ọtọ na Defence, Army, Navy and Air Force.

Ọ gbakwụnyere na a ga-eme nyocha ahụ ngwa ngwa n’ikwekọ n’arịrịọ nke Onye isi ala rịọrọ na mkpa maka iwugharị ọrụ nchekwa nke obodo Naijiria.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *