Take a fresh look at your lifestyle.

Ọkụ ime abalị agbapịala ngwaahịa ndị na-arụ akpụkpọ ụkwụ n’Arịarịa, Aba

0 220

Ọkụ agbapịala ụfọdụ ụlọahịa n’ahịa Arịarịa Aba, Abia Steeti, ebe ndị na-arụ akpụkpọ ụkwụ na-anọ, a na-akpọ ‘G Power Line’.
Ya bụ ọkụ malitere ịgba n’ebe elekere iri nke abalị ụbọchị Satọde, bụ ụbọchị asatọ nke ọnwa Maachị afọ 2023.
Dịka onye ntaakụkọ ndi nta akuko gara ebe ọkụ a gbara si hụ, ya bụ ihe mberede metụtara ụlọahịa karịrị 22, nke ihe karịrị mmadụ 100 na-anọ na ya.
Ọtụtụ ndị ahịa ahụ gwara anyị na ngwaahịa ha lara n’iyi n’ọkụ ahụ karịrị nde kwuru nde naịra.
Ụfọdụ kwuru na ọkụ ahụ malitere oge e wetara ọkụ latrik mana o dobeghị anya kpọmkwem ihe kpatara ya.
Otu onye ahịa ahụ kwuru na kpọrọ ndị ọrụ mgbanyụ ọkụ oge ọkụ ahụ malitere, mana ha enweghị ike ime ihe ọbụla n’ihi na okporoụzọ e si abanye n’ahịa ahụ jọrọ njọ nke ukwuu.
Gọọmentị Abia Steeti ekwubeghị ihe ọbụla gbasara ọdachi a.
Lee ụfọdụ foto si n’ahịa ahụ gbara ọkụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *