Take a fresh look at your lifestyle.

Ndị ojiegbe na-amanye ‘sit at home’ awakpoola ụlọakwụkwọ dina Enugwu steeti

0 237

Ndị ojiegbe na-amanye ndị mmadụ ịnọ n’ụlọ awakpoola Asata, Trans Ekulu, New Haven na ebe ndị ọzọ n’Enugwu Steeti.

Otu onye bi na mpaghara kwuru na ndị ojiegbe a wakporo ụlọakwụkwọ St. Michael Praịmarị dị n’Asata Enugwu steeti n’ụtụtụ ụbọchị Wenezde 5 Juun, 2023 ma malite ịgba egbe aghara aghara ma chụsasịa ụmụakwụkwọ na ndị nkuzi.

Ebe ndị ọzọ ndị a wakporo gụnyere, Trans Ekulu, ụlọahịa dị na New Haven, ahịa Artisan, Coal Camp, Uwani nakwa ebe ndị ọzọ.

Mwakpo a na-abịa dịka Simon Ekpa bụ onyendu otu ngalaba Indigenous People of Biafra (Ipob) nyere iwu n’ụbọchị iri ano nke onwa Juun, 2023 site n’akara Twitter ya, ka ndị mmadụ nọrọ n’ụlọ ruo ụbọchị ise na steeti ndị dị n’Ọwụwa Anyanwu.

O kwuru na ọ bụ iji mee ka gọọmenti Naịjirịa tọhapụ onyendu ha bụ Nnamdi Kanu, e jichiri kamgbe ọnwa Juun afọ 2021 ma kwadoo maka ntuliaka nnwereonwe Biafra a kpọrọ ‘referendum’.

Mgbe ndi nta akuko Igbo kpọrọ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n’Enugwu bụ Daniel Ndukwe, o kwuru na akụkọ ndị a bụ asị ọchị.

Mana onye ntaakụkọ ndi nta akuko Igbo nọ n’Enugwu kwuru na ọ hụrụ ebe ndị mmadụ na-agba ọsọ n’Asata n’ihi ụda egbe ndị na-amanye iwu ịnọ n’ụlọ na-agba.

O kwuru na ọtụtụ ndị mmadụ gbara ọsọ merụchara ahụ. Ọ gakwara n’ihu kwuo na ụgbọala na ụgbọelu helikọpta ndị ọrụ nchekwa na-akpagharị n’akụkụ Enugwu ugbua.

Nke a so akụkọ pụtara na ndị ojiegbe na-amanya ndị mmadụ iwu onye nọrọ n’ụlọ na steeti ahụ pụtara igosi ike ha.

Cheta na gọvanọ ọhụrụ steeti ahụ bụ Peter Mbah kwuru na mmalite ọchịchị ya na ya agaghi anabata ndị mmadụ isonye iwu onye nọrọ n’ụlọ na steeti ahụ.

Gọọmentị steeti ahụ gara n’ihu maa ọkwa n’ụbọchị Tuzde abali ano Juun, 2023 ka ụlọakwụkwọ, ụlọahịa nakwa ndị mmadụ ghara isonye ya bụ iwu dịka ha gwara ọha ka ha gaa mkpa ha na-atụghị ụjọ.

Gọọmentị steeti ahụ gara n’ihu wepụta ụgbọala ọhụrụ nye ndị uweojii steeti ahụ nke ha sị bụ “iji gosi mbọ ha na-agba n’ịchekwa ndụ na akụnaụba ndị Enugwu”.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *