Take a fresh look at your lifestyle.

Gọvanọ Kogi Steeti Achụọla Kọmishọna Na-ahụ Maka Ọrụ Ugbo Na Ndị Ọzọ

0 285

Gọvanọ Kogi steeti bụ Yahaya Bello achụọla kọmishọna na-ahụ maka ọrụ ugbo bụ David Apeh.

Ndị ọzọ a chụrụ n’ọrụ bụ onye ndụmọdụ pụrụiche nye Gọvanọ n’ihe gbasara nlekọta mberede, Maazị Danladi Isah-Yunusa, na Hajia Maryam Salifu, onye isi oche nchere oge, Kogi State Hotels and Tourism Board.

Ọchụchụ ndị mmadụ atọ a dị n’akwụkwọ ozi ode akwụkwọ gọọmentị steeti ahụ bụ Oriakụ Folashade Ayoade-Arike, na Lokoja na Tuzdee.

Ọ bụ ezie na enweghị ihe e kwuru kpatara nchụpụ Apeh, Ayoade-Arike kwuru na “Gọvanọ kwadoro nkwụsị n’ọrụ ya ozugbo.”

Ọ sịkwara na Isah-Yunusa na Salifu bụ ndị a chụrụ n’ọrụ ha n’ihi “omume rụrụ arụ.”

 

 

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *