Take a fresh look at your lifestyle.

Trade Union Congress Akatọọla Mwepụ Ego Enyemaka Mmanụ Ụgbọala

Helen Shok Jok dere ya na bekee

0 329

Ndị otu Trade Union Congress of Nigeria (TUC), na-ekwu na ọ bụ ihe anabataghị, iwepụ na mberede, ego enyemaka na mmanụ ụgbọala nke gọọmentị Naịjirịa mere ma gwa gọọmentị ka ọ laghachite n’ọnọdụ ọ dị.

Tupu onye isi ala Naijiria, Bola Ahmed Tinubu ekwupụta mwepụta a n’okwu mmeghe ya n’abalị iri abụọ na itoolu nke ọnwa Mee 2023, otu lita mmanụ ụgbọala na-ere otu narị naịra iri asatọ na ise n’ụlọ ọrụ na-ejuputa ma wụliri elu na naira puku ise kwa lita, ka ọkwa ahụ gasịrị.

Mgbe ọ na-agwa ndị nta akụkọ okwu na Abuja, isi obodo Naijiria ka ha nwesịrị nzukọ mberede nke National Excutive Council NEC  na Fraịde, Onye isi oche TUC, Mr Festus Osifo kwuru na “Congress enweghị obi ụtọ na mkpebi otu nke gọọmentị wepụrụ enyemaka mmanụ ụgbọala.”

“Atụmatụ anyị bụ na ha kwesịrị itinye aka na onye nnọchi anya ndị mmadụ bụ ndị ọrụ a haziri ahazi mana emere ya naanị otu.

Mgbe anyị kwuchara nke a, anyị chọrọ ikwu dị ka ndị a, na NEC na nnọkọ kpebiri na  mkparịta ụka na gọọmentị etiti ga-aga n’ihu ebe anyị na-achọ ka gọọmentị laghachi azụ n’ọnọdụ ọ dị,” ka o kwuru.

“Anyị gwara ha na ndepụta nke ihe ndị anyị chọrọ itinye n’ihu, anyị gwara ha na-agaghị edobe ha ugbu a ma tinye ha n’akụkụ akụkụ anyị, iji kparịta ma na-achọ ikike n’aka ha ihe ndị anyị nwere ike itinye n’ihu,” kwuru.

Nzukọ ahụ na ndị nnọchi anya gọọmentị dị ka ya si kwuo, mere ka nzukọ nke Fraịde dị mkpa.

“Ya mere, anyị enweela mkparịta ụka na NEC nyere anyị iwu ka anyị laghachi n’ọgbakọ ahụ ma tinye ihe anyị chọrọ n’aka gọọmentị.

Osifo kwuru, “Otu gọọmentị si meghachite arịrịọ anyị ugbu a ga-eme ka usoro ọrụ na-esote ga-echere ruo ụbọchị ụka mgbe anyị na ndị nnọchi anya gọọmentị ga-achọ usoro ọzọ anyị ga-eme.”

Nigeria Labour Congress NLC n’otu ụbọchị ahụ mekwara ọgbakọ mberede NEC ebe ha nyere ndị isi ya niile na otu ndị mmekọ aka ka ha mee ngagharịiwe n’obodo niile, ma ọ bụrụ na gọọmentị ewepụghị ọkwa ya n’ụbọchị Wenezde, abalị asaa ọnwa Juun, 2023.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *