E higharịala ikpe Peter Obi na Labour Party maka ntuliaka 2023 gaa Fraịde abali iri na itolu nke onwa Mee afo, 2023.
Tupu ha a malite, ụlọikpe jụrụ ịnabata onye ga-anochite Labour Party, dịka patị a kewara ụzọ abụọ.
Ụlọikpe mere nke a maka mmadụ atọ, nke gụnyere Lamidi Apapa (onyeisioche LP machiri), ọkaiwu Julius Abure (bụkwa onyeisioche LP, nke ụlọikpe machiri), na onyeisi ndị ụmụnwaanyị LP nọ na-azọ onye ga-anọchite patị ahụ.
Ọkaiwu Livy (SAN) kwuru na ha enwetabeghi akwụkwọ ruru 70% n’aka Inec. O jiri Inec ebe ahụ gwara ha Rivers steeti ma atụ, ebe o kwuru na onye ọrụ Inec sị na akwụkwọ EC8A adịghị.
O kwukwara na n’agbanyeghi na ha gara ụlọọrụ Inec ugboro ise, akụkọ ka ha na-anụ. Ọkwaiwu Livy kwuru na o degara ọkaiwu na-anọchitere Inec, bụ Abubakar Mahmoud (SAN), ka o leba anya n’inweta akwụkwọ ndị ahụ, nke ụloikpe si ha wepụta kamgbe Maachị.
Mana Mahmoud kwuru na ọ gbakwojuru ya anya. Na ndị otu LP abịaghi n’ụbọchị Mọnde abali iri na ise, ka ha siri kwuo
Ka ihe niile a na-eme, ụlọikpe chetara ha na mkpesa tupu ikpe ntuliaka e nwere kpọmkwem ga-eru ụbọchị iri na ano, nke pụtara na ụbọchị ikpeazụ ga-abụ Sọnde abali iri abuo na otu Mee afo, 2023.
Leave a Reply