Take a fresh look at your lifestyle.

Finland esonyela n’otu NATO: Lee ihe nke a pụtara maka nchekwa na Europe

0 464

Finland abụrụla mba nke iri ato na otu sonyere n’otu nchekwa Nato dịka e buliri ọkọlọtọ mba ahụ n’isi ụlọọrụ otu ahụ.

Nato bụ aha ịchafụ maka ‘North Atlantic Treaty Organization’ (Nato) nke bụ otu jikọrọ ndị agha mba dị icheiche na Europe.

Mịnịsta na-ahụ maka mmekọrịta mba Finland na mba ndị ọzọ zutere odeakwụkwọ mba Amerịka bụ Antony Blinken ma hafee ya akwụkwọ nkwekọrịta gosiri na ha esonyerela otu Nato.

Nsonye Finland na-esonyere Nato bụ ihe ịdọghachi azụ nye onyeisiala mba Russia bụ Vladmir Putin bụ onye na-ekwu na ya achọghị ka e nwee ọtụtụ ndị so na mba Nato n’oke ala Russia.

Nke a bụ maka na iwu Nato bụ na mba ọbụla wakporo otu n’ime mba so na Nato, mba Nato niile ga-ebuso mba ahụ agha

Russia na Finland nwere oke ala ruru kilomita 1,340.

                                                                                                                                     Ọ bụ n’ọnwa Mee afọ 2022 ka Finland na Sweden tinyere akwụkwọ isonye n’otu Nato

Ọnụ na-ekwuru mba Russia bụ Dmitry Peskov dọrọ aka na ntị na Russia ga na-ele anya ịmata ihe ga-eme na Finland, ma kwuo na Finland isonyere Nato “megidere atụmatụ nchekwa nke mba anyị”.

Finland na Sweden malitere ịchọ isonye Nato dịka Russia wakporo mba Ukraine n’ọnwa Febrụwarị afọ 2022.

Nke a pụtara na ọ bụrụ na mba ọbụla wakpoo Finland ugbua, mba niile so na Nato – tinyekwara mba Amerịka – ga-agbatara ha ọsọ enyemaka.

Onyeisi otu Nato b Ọọchịagha Jens Stoltenberg gwara ndị ntaakụkọ na nsonye a Finlad sonyere n’otu Nato “ga-eme ka Finland siwanye ike ma wepụkwa ụjọ”.

“Onyeisiala Putin kwuburu na ihe o ji wakpoo Ukraine bụ iji belata mba Nato nọ nso n’oke ala ha, mana ugbua, ọ hụla na ha na-abawanye.”

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *