Take a fresh look at your lifestyle.

Christine Nnaji: Nwata nwaanyị nwere ‘autism’ na-eji nka enyere ụmụaka ibe ya aka

0 392

ADS bụ ọnọdụ dị icheiche nke ihe na-akpata ya bụ mgbanwe dị icheiche n’ụbụrụ mmadụ.

O nwerike imetụta etu mmadụ si ahụta ihe maọbụ anabata maọbụ azaghachi ozi dị icheiche.

ADS na-enwe ogogo nke mbụ, nke abụọ, na nke atọ; ndị nwere ADS ogogo nke atọ na-achọ nkwado pụrụ iche oge niile.

Ụbọchị nke abụọ n’ọnwa Eprel afọ ọbụla bụ ụbọchị nke otu ‘United Nations’ wepụtara dịka ‘World Autism Awareness Day’.

A malitere emume a n’afọ 2007 iji na-agbasa ozi maka ọnọdụ ‘autism’ nakwa ịgbasa ozi maka ụzọ dị icheiche a ga-esi wulite ọnọdụ ndụ ndị nwere autism.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *