Take a fresh look at your lifestyle.

Onyeisiala Ghana ekwuola na e megharịla akụkụ ụfọdụ n’iwu megịdere ndị na-edịna okike ibe ha

0 385

Onyeisiala mba Ghana bụ Nana Akufo-Addo kwuru na Mọnde na iwu megidere ụmụnwoke na-edịna ụmụnwoke ibe ha nakwa ụmụnwaanyị na-edịna ụmụnwaanyị ibe ha nke ndị ụlọomeiwu mba ahụ na-arụrụitaụka maka ya, abụrụla ihe ‘emegharịrị’ site n’aka gọọmentị ya.

O kwuru nke a n’ọgbakọ izinye ndị ntaakụkọ ozi nke ya na osote onyeisiala mba Amerịka bụ Kamala Harris mere n’ụbọchị ahụ.

O kwupụtara na iwu a na-ewu abụghị atụmatụ gọọmentị kama na ọ bụ ihe ụfọdụ ndị nkiti wetaara ụlọomeiwu ha.

O kwuru na ọkaikpe gọọmentị ya zigaara ndị kọmịtịị ụlọomeiwu ihe iwu mba ha kwuru nakwa ihe iwu akwadoghi banyere mkpesa a ndị mmadụ na-eme n’okwu ndị na-edịna ndị okike ibe ha.

“Ihe ma ghọtara bụ na akụkụ gbara ọkpụrụkpụ n’iwu abụrụla ihe agbanwere site n’ozi ọkaikpe gọọmentị wetere” mana ọ kwụghị ihe ọzọ n’uju banyere okwu a.”

Onyeisiala Akufo-Addo ekweghị kwuo ihe ọ ga-eme ma ndị ụlọomeiwu binyeaka n’iwu a ga-emegide ndị na-edịna ndị okike ibe ha na Ghana dịka o kwuru na ọ ga-achọ ka ha tule ihe iwu nwereike isi metụta ikike dịrị ndị mmadụ.

Nwaada Harris kwuru na o gwaala Onyeisiala Akufo-Addo okwu maka ya bụ iwu ma kwuo na mba Amerịka na-eche n’iwu bụ metụtara ikike dịrị ndị mmadụ.

Ọ bụrụ na iwu a kpọrọ “Promotion of Proper Human Sexual Rights and Ghanaian Family Value Bill” dị ire, a ga-amalịte ịtụ ndị na-edịna ndị okike ibe ha nga dịka ikwado ikike dịrị ha ga-abụzị ihe megidere iwu na mba ahụ.

Ndị ụlọomeiwu mba Ghana mere okwu nrụrịtaụka n’ihu ọha banyere atụmatụ iwu a na 2021. O dobeghi anya mgbe ha ga-eme ntuliaka banyere inabata maọbụ ikagbu ya bụ iwu.

Ka ọ dị ugbua, mmadụ ejidere na-edịna onye okike ibe ya na Ghana na-aga nga ruo afo atọ ebe ọtụtụ ndị mmadụ anaghị akwado ụdịrị echiche a ma ncha mana iwu a dị ire, a ga-amalịte ịtụ ndị a nga ogologo afo karịa.

Akufo-Addo ekwubuola okwu n’oge gara aga megide ụmụnwoke ịlụ onwe ha nakwa ụmụnwaanyị ịlụ onwe dịka o kwuru na iwu mba ahụ agaghị akwado atụmatụ a n’ụwa a maọbụ n’ụwa ọzọ.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *