Take a fresh look at your lifestyle.

 Ihe mere aha Nnenna Oti ji malite na-ewu.

CHIGO DERE YA.

0 178

Ihe mere aha Nnenna Oti ji malite na-ewu.

Dịka a nọ na-eme ndọlị n’ime isi ụlọọrụ Inec n’oge ngụkọ nke Mọnde, ụfọdụ ndị nọ ebe ahụ chọrọ ka e mee mkpọpụta onye mmeri ebe vootu si akụkụ Obingwa na steeti ahụ erubeghi ụlọọrụ Inec aka.

Otu ụlọ ntaakụkọ a kpọrọ “Strenuous Blog” ziputara ozi na Tuzde, na-ebo Nnenna Oti ebubo na ọ tinyereaka n’imebi usoro ezi ntuliaka.

Ha boro ebubo na o kwuru:

“Arụọla m ọrụ na ndụ m niile na-akwụdoro usoro ọchịchị ziri ezi, anyị ga-akwụdoro ụkpụrụ ziri ezi”

“Dịka m bụ onye Pastọ nakwa nne mmadụ, mmụọ agaghị ekwe ka ma m mee ihe ga-emetụta ụmụ m n’ọdịnaihui, aga m eme ihe dị mma n’anya Chukwu nakwa n’anya ndị mmadụ.”

“Aga m eme ihe ọha chọrọ”

Mana odeakwụkwọ Inec bụ Rotimi Oyekanmi kụchapụrụ ihe a ụlọọrụ ntaakụkọ ahụ dere ma kwuo na mkpebi ịkwụsịtu ntuliaka esighị Oti n’aka kama o kwupụtara ihe isiụlọọrụ Inec nke Abuja zitere.

Ozi Inec hụrụ na ngụkọ kwụsịrị nke mere isi ụlọọrụ Inec n’Abia jiri kwuo na a ga-akwụsịtu ya bụ ihe ruo mgbe emezuru ntuliaka n’isi.

BBC

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *