Minista na-ahụ maka ọdịmma mmadụ, njikwa ọdachi, na mmepe mmekọrịta ọha na eze, Sadiya Umar Farouq, enyefeela atụmatụ mmefu ego afọ 2023 nke Mịnịstrị n’ụlọ omebe iwu.
Mịnịsta, nke onye odeakwụkwọ Nasir Sani-Gwarzo so n’oge nnyefe atụmatụ ahụ kwuru na ngụkọta ego dị N35, 595,233,430.00 bụ ego ekenyerela isi ụlọ ọrụ nke Mịnịstrị ahụ n’afọ 2022.
Atụmatụ mmefu ego ahụ nwere mkpokọta mmefu ugboro ugboro nke dị N1,073,705,755.00 yana isi ego maka ọrụ a fụrụ anya dị N34,510,760,413.00.
Na arụmọrụ nke mmefu ego afọ 2022, Mịnịsta ahụ gosiri na nchịkọta ego dị N291,652,083.36 ma ọ bụ pasent 58.3 ka e wepụtarala ruo 30th Septemba 2022 ebe nchịkọta ego dị NI,810,565,093.45 ma ọ bụ pasent 48.00 nke isi ego bụ maka ọrụ a fụrụ anya maka otu oge ahụ.
Ọ gara n’ihu kwupụta na ego dị N288,041,185.32, ma ọ bụ pasent 98.76 n’ime ego e wepụtara maka Overhead bụ nke e tinyere n’ọrụ, ebe pasent 99 nke ego ewepụtara, ma ọ bụ ego dị N1,799,286,437.81 bụ nke e jiri rụpụta Capital project nke mịnịstrị.
Na atụmatụ mmefu ego nke afọ 2023, ego ọrụ nke Mịnịstrị bụ nke e wenitere site na N499,975,000 na afọ 2022 ruo na N512,474,375 na afọ 2023 nke gosiri mgbago elu pasent asaa.
Farouq, kwuru na ọ dị mkpa ịmara na mmụba pasent asaa n’ego Overhead adabaghị adaba na mmụba ọnụ ahịa ego nke nọ pasent 20.77. N’aka nke ọzọ, e wedara ọnụ mmefu ego site na N3,749,510,414.00 gaa na N1,083,017,733 nke na-anọchi anya mbelata pasent 71 na ọnụ mmefu ego nke afọ 2022.
“Ọ dị mkpa iburu n’obi na mbelata pasent 71 na ego Capital na mgbago pasent 7 na ego Overhead dị ntakiri iji rụọ ọrụ mịnịstrị n’ime otu afọ”. Mịnịsta kwuru.
Na-agbakwụnye na maka mịnịstrị ahụ ịrụ ọrụ n’ozuzu oke, ma mezuo mkpebi ya nke dị oke mkpa maka mmepe obodo dum, mịnịstrị ahụ na-arịọ maka mmụba ma ọbụ mwelite ego nke Capital na Overhead
Na mbụ n’okwu ya, Onye isi oche kọmitii sineeti na-ahụ maka ọrụ pụrụ iche, SịnetọYusuf Yusuf, n’aha ndị otu kọmitii ahụ toro Mịnịsta na ndị otu ya maka ịrụ ọrụ mmefu ego nke afọ 2022 ma gwakwa mịnịstrị ahụ ka ọ gbatịkwuo mbọ ya n’ịrụ ọrụ enyemaka ya n’obodo.
Ike Umenaba.
Leave a Reply