Ụlọ ọrụ na-ahụ maka ọkụ eletrik n’ime obodo, Rural Electrification Agency( REA), na-ekwu na ha ebinyela aka na nkwekọrịta nke dị narị abụọ iri isii na asaa nke ọnụ ego ya ruru ihe dị ka nde narị dollar atọ iri itoolu na ise, iji nye ọkụ eletrik maka ndị Naịjirịa n’okpuru amụma Nigeria Electrification Project,(NEP).
Dị ka ụlọ ọrụ ahụ si kwuo, amụma NEP, nke e ji ego mbite sitere ụlọ akụ mba ụwa (World Bank) ya na Africa Development Bank (AfDB) akwado bụ nke nyerela nde mmadụ ise ọkụ eletrik.
Ihe dị ka nde dollar iri isii na anọ na ụma asatọ bụ ego enyeferela n’aka ndị nnọrọonwe maka itinye n’ọrụ a.
Onye isi ụlọ ọrụ REA, Ahmad Salihijo Ahmad kwuru na a na-atụ anya na amụma a ga-enye puku ezinụlọ asaa na ise, ụlọ ọrụ dị iche iche dị puku iri itoolu, na ụlọ nlekọta ahụike dị iche iche dị na mpaghara obodo a ọkụ eletrik.
Ọ kọwara na n’ime afọ ndị gara aga, REA esila n’ịbụ onye na-emejuputa atumatu nke ọrụ gọọmentị etiti na mpaghara ahụ wee bụrụ ebe na-enye aka na azụmaahịa.
“REA nwere ikike iwegara ụmụ amaala Naijiria ọkụ eletrik. Etu esi eme nke a dabeere n’ebe ego si abịa. Dịka atụmatụ itinye ọkụ n’ime obodo siri dị, anyị nwere ebumnuche na ọkụ ga-erute ndị Naijiria niile, a na-ekwukwa na ọnụọgụgụ ha ugbu a ruru nde mmadụ iri asatọ,” Ahmad kwuru.
O kwuru na a chọrọ nnukwu ego iji were mee nke a.
Ọ kọwara na site na ego a na-akpọ Rural Electrification Fund, bụ atụmatụ nke ụlọ ọrụ nnọrọonwe, REA na-enye aka ịhụ na ego na-abịa site na mpaghara dị iche iche iji nyere ya aka ịrụ ọrụ ya.
Ike Umenaba
Leave a Reply