Otu nwata nwere mmasị n’ụmụanụmanụ a kpọrọ Chibuike Napoleon akọwaala etu o si malite ịrụ ọrụ dịka onye na-edugharị ndị ọbịa bịara n’ọgịge ebe ana aelekọta anụmanụ.
Nwatakịrị a dị afọ iri na otu kwuru na mkparịtaụka na ọ bụ ka ọ gbara afọ isii ka ọ malitere ọrụ a.
O siri, “M gacha ụlọakwụkwọ lọta, mecha ihe m na-eme n’ụlọ, a gawa m ogige ụmụanụmanụ.”
O kwụrụ na ọ ga-amasị ya ịgụ akwụkwọ maka dọkịta ụmụanụmanụ, iji nye ya ohere ịna-eleta ha ma ha daa n’ọrịa.
Leave a Reply