Take a fresh look at your lifestyle.

Ogbaghara daputara n’ahịa Alaba, Legọs?

0 486

Akụkọ ruru ndi ntaakụkọ ntị ugbua bụ na ọgbaghara na-ada n’ahịa Alaba International Market dị na Legọs.

Ọnụ na-ekwuru onyeisi ndị alaba bụ Emmanuel Amaife sị na ọ bụ ndị “agboro malitere ọgbaaghara mgbe ndị ahịa gwara ha ka ha bupuchaa ụgbọala nakwa ndị ahịa mkpọwa ha na-edochi ụzọ ụgbọala na mmadụ si aga”.

Amaife sị na ndị agboro ahụ na-ana ndị mmadụ ego ma hapụ ha ka ha nọchie ụzọ.

Ọ sị na mgbe ndị ahịa chụpụrụ ndị ahụ ka ndị agboro ahụ malitere ịgbali egbe elu, nke butere ọgbaaghara ebe ahụ.

Ọsịkwa na, mgbe egbe tụpakwa ụfọdụ ndị mmadụ ebe ahụ.

Mana ka ọ ọ dị ugbua, ahịa mechiri emechi.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Legọs steeti bụ Benjamine Hundeyin sị na ha anụbeghị maka ọgbaghara a mana ka ya kpọọ onyeisi ndị uweojii ebe ahụ kpọghachị ya.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *