Take a fresh look at your lifestyle.

Peter Obi: Anyị amaghị ndị otu Afenifere sị na ha agaghị akwado ya

0 435

Pa Ayo Adebanjo so na ndị mbu hiwere otu Afenifere, ọ bụ ya bụ onyeisi ha ugbua

Ndị otu jikọtara ndi Yoruba niile bụ Afenifere ekwuola na ndị ahụ sị na ha anabataghị Peter Obi nke Labour Party dịka ka kwuru abụghị ndị otu ha.

Pa Ayo Adebanjo bụ onyeisi ndị otu a sị na “amaghị m ndị ha bụ.

Ihe anyị ma bụ na ọ bụ Peter Obi ka anyị kwadoro ga-emere anyị ihe anyị chọrọ.

Ọ gwara ndị ntaakụkọ sị,

“Unu egezịna ntị na ihe ndị ahụ na-ekwu. Nke bụ eziokwu bụ na ndị Igbo anọbeghị n’isi ọchịchị na Naịjirịa. Anyị bụ ndị Yoruba achịala. Ndị ọzọ achịkwaala. Ọ bụghị anyị nọ mgbe Naịjirịa malitere na-ekwu okwu ụmụazị a na-ekwu. Ụnụ egezịna ndị ahụ ntị”.

Adebanjo sị na Afenifere kwu na eziokwu na Ikpe nkwumọtọ, ọbụghị abụrụ ebe onye isi maọbụ ụka onye na-aga.

Ndị otu Afenifere ọzọ kpọrọ onwe ha Afenifere Renewal Group sị na Pa Adebanjo na-ekwu uche obi ya.

Mgbawara otu ahụ nke Olawalu Oshun n’isi ya sị na ọ bụ Tinubu ka ha na-akwado.

Ọ sị na Afenifere bụ maka ọdịmma ndị Yoruba. N’ihi ya ọ gaghị adị mma ịkwado onye ọzọ na ndọrọndọrọ.

Oshun sịkwa na ọ bụghị ezie na ha ebughị ọdịmma Naịjirịa n’uche, mana na isi ọrụ ha bụ ọdịmma ndị Yoruba.

Ọ sị, “ihe anyị ji akwado Tinubi ugbua dịka nwaanyị bụ maka na ọ bụ maka na ọ bụ ya kacha ewu ewu n’ime ndị niile pụtara”.

Peter Obi: Anyị amaghị ndị otu Afenifere si na ha agaghị akwado ya

Onye bụ Ayo Adedebanjo?

  • Onye Ijebu-Ogbo dị n’Ogun steeti, Ayo Adedebanjo bụ onye ndu otu Afenifere, otu na-ekwuru ndị Yoroba.
  • Ọ bụ ọkaiwu mna onye ndọrọndọrọ ọchịchị aka ochie na Naijiria dịka o so na ndị nsonso Nnamdi Azikiwe nakwa Obafemi Awolowo, onye ndu ndị Yoroba a mara ama lara mmụọ.
  • Ọ rụrụ ọrụ ntaakụkọ tupu ọ gụọ maka ịbụ onyeọkaiwu na mba Briten.
  • Ọ bụ onye kwenyere na mpaghara ọbụla ịnọọ nna-eri nke ha kpatara bụ nke Bekee kpọrọ ‘restructuring’ maọbụ ‘true federalism.
  • Ọ bụ onye a ma ama dịka onye na-agba mbọ maka ikike dịrị onye nakwa o onye otu Nadeco.

Ihe ị kwesịrị ịma maka otu Afenifere

Afenifere bụ otu jikọrọ ndị agbụrụ Yoruba niile agbanyighị ebe ọbụla ha nọ n’uwa.

A malitere ya n’afọ 1998 mgbe onyeisi mbụ ha bụ Abraham Adesanya, Osote ya bụrụ Bola Ige.

Ndị ọzọ so hiwere ya bụ otu Afenifere bụ Pa Onasanya, Chief Reuben Fasoranti, Adegbonmire, Femi Okurounmu, Ganiyu Dawodu, Olanihun Ajayi, Olu Falae, Adebayo Adefarati, Alhaji Adeyemo na Ayo Adebanjo.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *