Take a fresh look at your lifestyle.

Ihe di na nwunye nwere ike ime iji mụta nwa nwoke

0 735

Ị mụta nwa nwoke n’ezinụlọ dị oke mkpa n’ala Igbo.

Igbo kwenyere na ama ọbụla na-amụtaghị nwa nwoka ga-echi.

Ya mere ha jị agụ nwoke aha dịka Obiechina, Amaechina na ndị ọzọ.

Ọtụtụ ezinaụlo akụsaala maka amụghị nwa nwoke.

Ya bụ, ọ dị ezigbo mkpa ịmụta nwa nwoke n’ezinaụlo, ya mere anyị ji ede akụkọ a.

Onye dọkịnta na-ahụ maka ahụike ụmụnwaanyị bụ Kingsley Ekwuazi tinyere ọnụ n’ihe ụfọdụ di na nwunye nwere ike ime maka ọnọdụ a.

Oge e ji enwe mmekọ nwoke na nwaanyị (Billings Method)

Nke a bụ nchọputa na-egosi na o nwere oge nwoka na nwaanyị ga-enwe mmekọrịta ha enwee ike mụta nwoke maọbụ nwaanyị.

Usoro na-ekwu na ọ bụrụ na nwaanyị nwee mmekọrịta mgbe akwa ya na-apụta (Ovulation), na ọ ga-ama otu ụbọchi n’izụahụ akwa nwoke ya ga-apụta.

Ọ na-akọwa na ina enyocha ka mmiri ahụ nwaanyị (vaginal mucus) g si dị mgbe niile ga-enyere gi aka ịmata mgbe gị na onye nke gị ga-eji mee aramara.

Ọ bụ site na-iji ihe e ji enyocha ya bụ mmiri ahu nwaanyị ka ị ga-esi amata.

Onwere ihe a na-ere na famasi ị ga-eji elele ya kwa mgbe.

Nwaanyị nwekwara ike iji nghọta nke ya maka mgbe o ji anọ nso amata ya.

N’aka nke ọzọ, nwoke ọ bụ ya na nwaanyị ahụ agaghị agbọncha (masturbation) ihe dịka abali abụọ tupu oge ahụ ha ga-enwe mmekọrịta.

Nwoke ahụ ga-agbanwekwa ụdị nrị ọ na-eri nakwa otu o si ebi ndụ nke ga-enyeaka ka uhe (Sperm) ya nwee ume.

Ọ dị mkpa ime ka uhe nke nwoke gị gbasie ike maọbụrụ na ị chọrọ nwanwoke.

Ụdị nri ị na-eri

Ọ bụ eziokwu na ezigbo nri na-edozi ahụ mana ọtụtụ amaghị na ụdị nri ị na-eri nwere ike ịme ka ị mụta nwoke maọbụ nwaanyị.

Mmụta na-egosikwa na nwaanyị iri nri nwere “alkaline” ga-enyeaka ime ka imeahụ nwaanyị (cervics) ebe uhe nwa na-anọ nwee ike ị nọ n’ụdị ga-enye aka ka uhe nke nwoke (male sperm) nwee ahụike ito nke ọma.

 

Uhe nke nwoke anaghị anọlị n’ahụ nwaanyị nwere asidi karịrị akarị dịka nchọpụta a kwuru.

Nri dịka tomato na nri ndị ọzọ nwere ike ime ka “alkaline” dị nwaanyị n’ahụ karịa “acid” ya.

Ọzọ nwere ike ịtụ mmadụ na-anya ma ghara ịtụkpọ ya bụ oge mmadụ ji eri ihe nwere ike ikwu ka ọ bụ nwoke ka ọ bụ nwaanyị ka onye ahụ ga-amụ.

Nchọpụta na-egosi na nwaanyị iri nri nwere nnukwu “calorie” n’ụtụtụ nwere ike ịme ka ọ tụrụ ime nwoke.

Ya bụ nchọpụta sịkwa na i ri nri nwere “potassium” na “sodium” nwekwara ike inyeaka ka nwaanyị tụta ime nwa nwoke.

Mana dọkịta Kingsley Ekwuazi sị na okwu gbasara “alkaline” agbasaghị ndị ọrụ ahụike Bekee.

Aha onyonyo,

Fertility Boosters: Ihe ise nwaanyị kwesịrị ịme iji tụrụ afọ ime

N’otu aka ahụ, iri nri “calcium” akarịghị na ya ga-enyekwa aka dịka ya bụ nchọpụta kwuru.

Ya mere mgbe gboo, ụfọdụ ndị ọcha na-ata nnu nkiti ka o nyere ha aka ịtụ ime nwa nwoke.

Ụfọdụ na-eche na ebe ịta nnu nkiti adịchaghị mma, nchọcha na-egosi na “sodium” (nnu) na-enyeaka ịtụta ime nwanwoke.

Infertility in women: ‘A na-akpọ m osisi amịghị mkpụrụ’- Nwaanyị chọgoro nwa ọtụtụ afo

Ịnwe mmekọ ụbọchị akwa nwaanyị kacha apụta (Pick ovulation day) – Shettle Method

Nchọcha na-akọwa na nwaanyị ịnwe mmekọ mgbe akwa nwaanyị pụtasiwere ike nwere ike ịme ka ọ tụta ime nwoke ngwa ngwa.

A na-eji akụrụnga nnyocha Bekee kpọrọ ‘home ovulation detection kit” amata oge a.

Ọzọ dịkwa na usoro a bụ ka nwoke dumisie amụ ya ike n’ahụ nwaanyị nke ga-enyere uhe nke nwoke (male Sperm) aka ịgbapụ ọsọ ozugbo were buru uzo rụrọ ebe akwa nke nwaanyị dị.

Uhe nke nwoke na-aka mpe ma na-agbakwa ọsọ karịa uhe nke nwaanyị bụ nke ka ya ibu.Udo

Nchọpụta gosikwara na nwaanyị ibu ụzọ “bịa” na-enyeaka ịme ka “alkaline” ju n’ime ahụ ya nke ga-enyere uhe nke nwoke aka ịgbapụ ọsọ ngwangwa.

N’ime ka Shettle na Billings methods dị ire, nwaanyị kwesiri ịmata mgbe nso ya nakwa akwa ya ji apụta.

Itinye uhe n’efere akwa (Sperm spinning and Pre Implant Genetic Testing)

 

Usoro ọzọ na-arụ ọrụ ngwa ngwa bụ iji usoro IVF na nke Bekee kpọrọ “Sperm spinning”.

Usoro a bụ nke ana amịta uhe nwoke tinye na mmiri akwa nwaanyị.

Ihe ị ga-ahụ ọzụgbo bụ na uhe nke nwoke ga-eji ọsọ gakwuwe nke nwaanyị.

Nke ahụ ga-enyeaka ịmata nke bụ uhe nwoke na nke nwaanyị mezia ka ewepụta nke nwoke were sie nke nne.

A na-etinyekarị usoro a na IVF n’ọrụ otu mgbe, agbanyeghị na ọ dị okeọnụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *