UK nyere ndị dọkịta 266 ikike n’ime ọnwa abụọ
General Medical Council nke nyere ikike ma na-edobe ndekọ aha ndị ọkachamara ahụike na United Kingdom nyere ndị dọkịta Naijiria ruru 266 ikike na June na Julaị 2022.
Ihe ọ pụtara bụ na opekata mpe ndị dibia bekee Naijiria atọ nwetara ikikere kwa ụbọchị na June na Julaị afọ 2022 n’agbanyeghị ihe gọọmenti etiti mere iji kwụsị ọpụpụ nke ndị dọkịta na ndị ọrụ ahụike na mba ahụ n’ihi akwaliteghi n’ọrụ nke mba ahu na-enye ha.
Ọnụọgụ a agụnyeghị ndị dọkịta ndị ọzọ si Naịjirịa bụ ndị na-enwetaghị ọzụzụ ahụike na Naịjirịa.
Ka ọ dị ugbu a, Naijiria nwere ọnụ ọgụgụ di ukwu bụ ndị dọkịta na-arụ ọrụ na UK na-esote India na Pakistan.
Otu Medical and Dental Council nke Naijiria kwuru na Naijiria nwere ugbua ihe karịrị ndị dọkịta 100,000 debanyere ha aha.
Leave a Reply