Take a fresh look at your lifestyle.

Lee nwamadi tughariri Kọran n’asụsụ Igbo

0 533

Murtala Mohammed Chukwuemeka Amaeze bụ onye Orlu n’Steeti Imo mana ọ bụ onye okpukperechi Alakụba, ma bụrụkwa onye tụgharịrị akwụkwọ nsọ ndị ha bụ Kọran n’asụsụ Igbo.

Murtala Mohammed Chukwuemeka kwuru na ya banyere okpukperechi Islam n’afọ 1988.

Amaeze gara n’ihu kọwaa na alakụba batara ala Igbo kamgbe afọ 1745.

Ọ kọwara na e nwere Koran n’asụsụ Awụsa na Yoroba kama enweghị ya n’asụsụ Igbo.

Ọ kwuru na ihe ọ mere kwesịrị inye ndị Igbo ọṅụ.

Amaeze gwara ndi ntaakuko na o were ya afọ ise ịtụgharị Koran n’asụsụ Igbo.

Onyeis ụlọ ofufe ebe Amaeze na-efe ofufe bụ Akinyemi Ibira kwuru na obi dị ya ụtọ na ọ bụ onye ụka ya tụgharịrị Koran n’asụsụ Igbo.

Amaeze kwuru na anaghị amanye mmadụ ịbụ onye alakụba kama na ọ bụ mkpebi nke onwe.

O kwukwara na ọ bụghị n’ihi ego mere ya ji tụgharịa Koran n’asụsụ Igbo, kama ọ bụ iji wulite okwukwe ndị Igbo ndị ọzọ bụ ndị okpukperechi alakụba.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *