Take a fresh look at your lifestyle.

Nwaanyị isiojii nweterela ‘Comercial Pilot License’ n’mba US

0 388

Miracle Izuchukwu bụ nwada si Ogidi, nke Steeti Anambra,mpaghara owyuwanyanwu ala Naịjirịa, batara mba Amerịka ịbịa gụọ akwụkwọ ka ọ bụrụ nọọrụ. Ọ sị na ọ bụ ọrụ nne ya gwara ya ọ ga-arụ n’Amerịka iji bụrụ mmadụ. Mana dịka ọ gara nwalee ịnya ụgbọelu, obi ya niile abanyezie n’ịbụ onye na-anya ụgbọelu. Nne na nna Miracle anabataghị atụmatụ a dịka Miracle si kwuo.

Ọ sị na ha ekweghi akwado ya na ego ọ ga-eji amụ ya bụ akaọrụ. Nke a mere Miracle jiri gbasie mbọ ike, chọwa ego na enyemaka ịgụ akwụkwọ n’efu dị iche iche nke a na-enye ndị na-agụ akwụkwọ n’Amerịka.

Ugbua, Miracle Izuchukwu enwetela asambodo ‘Comercial Pilot License’ nke nyere ya ikikere iji na-ebuzi ndị mmadụ. Ugbua ọ na-agbalịzi ịgbazu oge elekere 3,000 n’elu nke ga-eme ka o bidozie ibu ndị mmadụ n’ọdọụgbọelu.

Nne na nna Miracle Izuchukwu jizi ya eme ọnụ dịka ọtụtụ ụmụ Naịjirịa kpụzi aha ya n’ọnụ.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *