Bola Ahmed Tinubu ji ọkọlọtọ All Progressives Congress akatọla ndị mmadụ na-ekwu na otu achụm nta vootu ya gaa kpọta ndị ekperima ka ha jikere ka ndị ụkọchukwu bia mgosipụta osote ya bụ Kashim Shettima n’ụbọchị July 20, 2022.
Pati APC gosipụtara Sinatọ Shettima bụbụ gọvanọ Borno steeti dịka osote onye otu ha na-azọ ọkwa onyeisiala na ntụliaka Naịjirịa na-abịanụ.
Ka emechara ya bụ emume na Shehu Yar’adua centre dị n’ Abuja, ihe ndị mmadụ na-ebo APC bụ na ha gobiri ndị agbero ka ha yiri uwe ndị ụkọchukwu bia ya bụ mmemme.
Mana Tinubu site n’ọnụ onye nnọchiteanya ya n’ihe gbasara achụm nta vootu bụ Bayo Onanuga ekwuola na foto na onyonyo ndị ahu na-efegharịnụ bụ ihe ndị iro ya ji emegharị anya ndị mmadụ.
“Anyị chọrọ ikwu na ndị ụkọchukwu ahụ abụghị adigboroja, ndị na-arụ ụgbọala maọbụ ndị na-ere ji dịka ndị na-ebugharị okwu akpọmasị si eme ka ndị Naịjirịa kwenye. Ha abụghị ndị ọnụ na-eru n’okwu n’okpukperechi Kraist mana na-agbagote n’ozi ha, dịka akwụkwọ ozi o depụtara si kwu.
Ihe APC sara maka ndị ụkọchukwu pụtara kwado Tinubu
APC kwuru na ‘Muslim-Muslim Ticket’ emegịdeghị iwu Naịjirịa kama ndị ma ọrụ bụ ihe ka mkpa.
Otu pati All Progressives Congress (APC) asaala ebubo dapụtara n’okwu ndị ụkọchukwu ụka Kraịsti pụtara kwado Bola Ahmed Tinubu na onye osote ya bụ Kashim Shettima n’emume pati a mere n’Abuja n’ụbọchị Wenezde.
Ọnụ na-ekwuru pati a bụ Philip Muoka gwara ndi ntaakụkọ n’ụbọchị Tọọzde na n’ezie ha amaghị maka ndị ụkọchukwu ahụ. Nke a bụ asịsa okwu ma ndị ụkọchukwu ahụ a bụ ndị ezie ka ha abụ ndị adịgboroja.
O kwuru: ‘Emume anyị mere bụ emume ọha, ọ bụghị nke okpukperechị, anyị amaghị ndị ụkọchukwu ahụ bụ, anyị akpọghị ndị ọbụla oku’.
Muoka kọwara na ndị otu nkwado ọbụla nwere ikike bịa ya bụ emume n’ihi na ọ bụ nke emepeere ndị ọha niile.
Ọ gara n’ihu kwuo: “Ndị okpukperechi niile nwere ikike dịịrị ha ikwado onye ọbụla ha chọrọ, ndị ụkọchukwu a pụtara gosiri ikike dịịrị ha”.
Maka okwu nhọpụta ndị Alakụba abụọ ga-azọrọ APC ọkwa onyeisiala na osote ya na-akpalite ọtụtụ okwu, Muoka kwuru na okpukperechi abụghị ihe kacha dị mkpa n’ọchịchị.
O kwuru: ‘Gini mere ndị mmadụ anaghị akatọọ PDP bụ ndị megidere iwu pati ha nke kwuru ka a na-enye ndị si mpghara dị ịche ịche ohere ọchịchị’.
O kọwara na PDP họpụtara onye si mpaghara ugwu ebe iwu ha rụrụ aka na ọ kwesịrị idanyere ndị ndịda.
Muoka kwukwara na ndị na-anaghị akatọọ PDP ma na-akatọ APC maka ‘Muslim Muslim Ticket’ bụ ndị iru abụọ.
Otu n’ime ndị ụkọchukwu a na-ewu ugbua ebe niile gwara ndi nta akụkọ okwu maka ihe mere o jiri sonye n’ememe ahụ.
‘Ihe mere m ji sonye ndị Bịshọp kwadoro Tinubu’ – Onye amụma Ugo Ugokwe
Ugo Ugokwe Prince bụ otu n’ime ndị ụlọchukwu ụka Kraịsti so pụta kwado otu Pati All Progressives Congress (APC) n’emume eji kọsipụta Kashim Shetimma dịka osote Bola Tinubu akọrọla ndi ntaakụkọ ihe mere o ji sonye n’emume.
Kemgbe APC kwupụtara na onye ga-azọrọ ha okwa onyeisiala nakwa osote ga-abụ ndị ụka alakụba, ụzụ akụkọ nakwa nkatọ na-agba n’okwu a n’ihi ụfọdụ ndị ụka Kraịsti kwuru na mkpebi a APC mere ezighi ezi.
Na mkparịtaụka Ugokwe na ndi ntaakụkọ nwere n’ụbọchị Tọọzde, Ugo sara asịsa ndị na-ekwu na ọ bụghị ndị ahụ pụtara ya bụ emume abụghị ndị ụkọchukwu n’ezie.
O kwuru kpọm kwem na ya na onwe ya bụ onye ụkọchukwu nke malitere ọrụ mgbasaozi ụka Kraịsti kemgbe afọ ole m ole.
Ọ kọwara na ihe kacha bụrụ ụkpụrụ ozi ya bụ udo na ịdịnaotu.
Ọ kwuru: “E kwenyere m n’udo na ịdịnaotu Naịjirịa, ahụghị m ihe ọjọọ dị na ịpụta kwado onye ga-achị Naịjirịa, ihe bụ ikike dịrị m dịka mmadụ”
Ọ gara n’ihu kwuo na otelarị o ji arụ ọrụ ịjịkọ nakwa ikpe udo n’etiti ndị ụka Kraịsti nakwa ndị ụka Alakụba.
Ugokwe kwuru “E nwere m ụlọọrụ na-ahụ maka njịkọ ndị okpukperechi abụọ a maka na aghọtara m na ọtụtụ ngọteghe na-adapụta n’etiti ndị okpukperechi abụọ nke mere m ji na-agba mbọ ihazi ma kpezie nghọteghe a”.
Ugoekwe kwukwara na ọ bụ onye otu pati APC nke zọrọla ọkwa dịka osote onyeisi ndị ntorobịa APC n’Ọwụwa Anyanwụ Naịjriịa.
Ọ kọwara na n’ezie na ha nyere ndị isi ndụmọdụ ka ha ghara iso ụzọ nhọpụta ndị ụka Alakụba abụọ dịka onyeisiala nakwa osote ya mana ebe ha merela ya na nkwado ya dịka onye obi udo ga-agara APC.
N’okwu ya ọ sị “Chineke nwereike iji onye ụka Alakụba maọbụ onye ụka Kraịsti gbapụta Naịjirịa, okpukperechi mmadụ abụghị ihe na-ekwu ma onye ahụ ama ọrụ maọbụ ọ maghị ọrụ”.
Leave a Reply