Onye ji okwa dika Prezidenti ụlọ ọbaego African Development Bank, AFDB bụ,Dr. Akinwumi Adesina nọna mba Kenya maka njem ọrụ abali anọ.
Na ime ogea njem a, Dr. Adesina ga-enwe nzukọ yana gọọmenti mba Kenya iji nyocha ọrụu ndi ụlọ ọbaego a nyere ego ka arụ n’mba ahụ.
Oga eje zute onyeisiala mba Kanya bụ,Uhuru Kenyatta na Nairobi n’ụbọchi Tuuzde,nakwa ndi isiọrụ ọzọ gunyere Minista nke National Treasury and Planning bụ, Ambassador Ukur Yatani Kanacho,bụkwa onye Group Gọvanọ nke African Development Bank n’mba Kenya.
Oga agakwa hụ ndi otu diplomatic corps, na ndi nnọchite anya the Bank’s international development partner countries n’olu bekee iji kpa nkata di oke mkpa.’
Ọrụ eji n’aka
ọrụ ndia AFDB n’akwado na Kenya gunyere okporo-ụzọ Kenol-Sagana-Marua Highway Improvement Project,so na mpaghara Kenya’s section nke Cape ruo Cairo trans-Africa highway bụ nke ana ewulite iji nye aka maka mba na mba izurikọta ahia n’Afrika.
Ụlọ ọbaego African Development Bank so akwado okporo-ụzọ di 84 km na Kenya site n’inye ego di €178 million. Ọrụ ndi ọzọ gunyere Africa Growing Together Fund (€31 million) na Goomenti mba Kenya (€49 million).
Dika ndi ụlọ ọbaego AFDB malitere ọrụ na Kenya kamgbe afọ 1967 ruo n’ọnwa April afo 2022,ha enyela mba Kenya ego di $6.3 billion iji nyere ha aka n’ọrụ.
Leave a Reply