Ndị ọchịchị Uganda kwụsịrị ịntanetị ma belata ọrụ ekwentị mkpanaaka maka ntuliaka.
Chigo deziri ya n' igbo
N’ụbọchị Tuzdee,Ndị ọchịchị Uganda kwụsịrị ịntanetị ma belata ọrụ ekwentị mkpanaaka n’ofe mba ahụ ụbọchị abụọ tupu ntuli aka a ga-eme, nke Onye Isi Ala Yoweri Museveni ga-asọ mpi maka oge nke asaa—mkpebi a na-ekwukarị na ọ na-akpalite esemokwu—mgbe o jiri ihe dị ka afọ iri anọ n’oche ọchịchị.
Uganda Communications Commission (UCC) nyere iwu ka ndị na-enye ọrụ ekwentị na ịntanetị mechie njikọ ịntanetị ọha site n’elekere 6 nke mgbede (1500 GMT), iji gbochie “ozi ụgha, ozi e tụrụ ụgha n’obi, izu ohi ntuli aka, na ihe ize ndụ ndị metụtara ya.”
N’oge na-adịbeghị anya tupu ntuli aka ahụ, ndị agha na ndị uwe ojii ejidere narị mmadụ n’ime ndị na-akwado mmegide, ma gbaa mgbọ na gas anya-ụkwara (tear gas) ugboro ugboro n’oge mmemme mgbasa ozi ntuli aka na-akwado onye na-asọ mpi kacha sie ike megide Museveni, bụ Pop star Bobi Wine.
Museveni, onye dị afọ 81, batara n’ike n’afọ 1986 mgbe o duru nnupụisi afọ ise. Ọ bụ Onye Isi Ala nke atọ kacha nọrọ ogologo oge n’oche n’Afrịka.
Leave a Reply