Take a fresh look at your lifestyle.

Lee ihe ụlọorụ ndị agha Naịjirịa kwuru maka onye agha nwaanyị sịrị na ndị isi ya na-emekpa ya ahụ

0 133

Ndị agha Naịjirịa e tinyela ọnu n’ihe onyonyo na-efegharị ebe niile bụ nke gosiri otu onye agha nwaanyị ka ọ na-ekwu na ndị isi ya na-emekpa ya ahụ n’ọrụ maka na o kweghị idina ha.

Ha kwuru na ha ga-elebanye anya n’ihe nwaada ahụ kwuru ma hụ na ha kpuhere ihe niile zoro ezo.

N’ozi ha zipurụ n’akara ọbaozi X ka ha kwuru sị ‘’Anyi na-agwa ndị Naịjirịa na ụlọọrụ agha Naịjirịa bụ ụlọọrụ gbadoro ụkwụ n’ezi ọmume na ugwu ndị ọrụ ya, n’ihi nke a, anyị ga-eme nnyocha pụrụiche i ji hụ na anyị kpuhere ihe niile gbasara nke a’’.

‘’Anyi na-arịọ ndị Naịjirịa ka ha nweere anyị ndidi dịka anyị nọ na njem nnyocha a’

N’ihe onyonyo ahụ, nwaada ahụ kwuru na o nwee ihe mere ya, sị nwụchie ndị isi ya bụ Col IB Abdulkareem, Col GS Ogor na Gen IB Solebo, na ọ bụ ha na-enye ya nsogbu n’ọrụ agha Naịjirịa.

O kwuru na Abdulkareem emekpaala ya ahụ ọtụtụ oge, na ọ gbara ya ọgwụ ya na nabataghị, chụpụ ya n’ụlọ ya ma kpọchịe ya n’ụlọọgwụ ndị nwere ọrịa isi.

O kwuru na mgbe ọ bụla ya choro ịgwa ndị mmadụ ihe a na-eme ya, ndị isi ya na-agwa ndị ahụ na ya nwere isimgbaka.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *