Take a fresh look at your lifestyle.

Sierra Leone chọrọ iweghara ọchichi: E tinyela mmachi ngagharị

0 489

Ọgbaghara adaala na mba Sierra Leone dịka akụkọ pụtara na-ekwu na ndịagha chọrọ iweghara ọchịchị n’ike.

Mba ahụ na-ada kata-kata ugbua dịka a na-ekwu na e nwere ndị agha a na enyo chọrọ iwere ọchịchị n’ ike.

E tinyela mmachi ngagharị na Sierra Leone dịka ndị bu egbe wakporo ụlọmkpọrọ tọhapụ ndị e ji eji.

A tọhapụrụ dị e ji eji na mkpọrọ ‘Central Padema Road Prison’ dị na Freetown, isiobodo mba ahụ n’ụtụtụ Ụbọchịụka, dịka ndị na-arụ na mkpọrọ ahụ si gwa ndi ntaakuko.

Na mbụ, ndị bu egbe wakporo ogige ndịagha n’obodo ahụ.

A mabeghị ndị nga ole gbafuru mana ozi nke Ngalaba na-ahụ maka nchekwa nke Mba Amerịka ( US State Department ) wepụtara n’afọ 2019 nke rụtụrụ aka na ewbigara mmadụ oke n;ụlọmkpọrọ ahụ kwuru na mmadụ puku abuo nọ na mkpọrọ ahụ.

Ndi bi ebe ahụ kwuru na ha ṅụrụ ụda egbe n’ ogige ndịagha nke dị nso n’obi Onyeisiala mba ahụ.

N’ozi nke o si n’ụlọ zipụta n’ụtụtụ a, Onyeisialaa Julius Maada Bio gwara ụmụamala mba ahụ na ihe nile e derela jụụ, na-anọ achọ ndị kpara arụ ahụ.

Mana onyentaakụkọ anyị nọ na Freetown kwuru na a mabeghị ka ihe siri kwụrụ kpọmkwem.

O ji ụgbọala ya gagharịa ma hụ ndịagha kwọ ngwaagha n’ụgbọala ndịuweojii, ọ hụkwara ndị ọzọ na-eti mkpụ sị na ha na-akwado, ‘ikpocha Sierra Leone’.

Otu Ecowas, mba Amerịka na Briten akatọla tigbuo-zogbuo ahụ.

N’ọnwa Juun, ka a họpụtara Onyeisiala Julius Maada Bio agba nke abụọ ya.

N’ọnwa Ọgọstụ, a nwụchiri ndị mmadụ gunyere ndịagha welitere isi bụ ndị a na-ebo ebubo na ha kpara nktata ịkwatu Onyeisiala n’oche ya.

N’afọ atọ gara aga, e nwela nkwatu ọchịchị n’ike n’ụfọdụ mba gụnyere mba Guinea ha na Sierra Leone gbara agbata obi bụ ebe ndịagha nọ n’ọchịchị ugbua.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *