Take a fresh look at your lifestyle.

Tigbuo zogbue ka na-aga n’iru na Gaza.

Lantana Nazir.

0 501

Ashraf al-Qudra, ọnụ na-ekwuchitere Mịnịstrị ọrụ ahụike Gaza  tinyekwara ndị ọrụ ahụike nke Gaza na ndị agha Israel wakporo ụlọ ọgwụ Indonesian dị na Northern Gaza, .Hamas kwukwara  na e gburu ihe dị ka mmadụ iri atọ na mwakpo ndị Israel wakporo ụlọ akwụkwọ jikọrọ aka na United Nations na ogige ndị gbara ọsọ ndụ Jabalia na ugwu Gaza.Ihe karịrị ndị ọrịa 200, ndị ọrụ ahụike, na ndị a chụpụrụ n’ebe obibi ha nọ ugbu a n’ụlọọgwụ dị na Beit Lahiya,
Palestine Wafa ụlọ ọrụ mgbasa ozi Palestine   siri kwuo na ka ọ dị ugbu a, ụgbọ elu ndị agha Israel meriri mpaghara Sheikh Nasser na Khan Younis na ndida  Gaza Strip, gbuo opekata mpe mmadụ ise ma merụọ ọtụtụ mmadụ ahụ,

Palestine Wafa kọwakwara na ọ dịkarịa ala mmadụ iri nwụrụ mgbe ndị agha Israel wakporo ụlọ obibi dị na mpaghara Sheikh Radwan na ugwu Gaza.

Na West Bank, ndị agha Israel gbagburu Mohammed Ibrahim Fuad Edely dị afọ 12, dịka ozi ndị Palestine siri kwuo.

Ihe ahụ merenụ butere ọnụ ọgụgụ ndị Palestine gburu na West Bank kemgbe October 7 ruo 229, 52 n’ime ha bụ ụmụaka.

Mwakpo ogbunigwe nke Israel egbuola ihe karịrị mmadụ 14,800 na Gaza kemgbe October 7, dị ka ndị ọrụ Palestine siri kwuo.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *