Take a fresh look at your lifestyle.

Gọọmentị ga-atọhapụ mmadụ 4,068 nọ n’ụlọmkpọrọ na Naịjirịa

0 170

Gọọmentị Naịjirịa ekwuola na ha ga-atọhapụ mmadụ puku anọ na iri isii na asatọ e ji eji n’ụlọmkpọrọ ka ha nwere onwe ha.

Minista na-ahụ maka ihe na-eme n’ime obodo bụ Olubumi Tunji-Ojo kwuru nke a mgbe ọ na-agbape atụmatụ e ji atọhapụ ndị a n’Abuja n’ụbọchị ụka abali iri na itolu nke onwa Nọvemba, 2023.

O kwuru na ha na-eme nke a iji belata ọnụọgụgụ ndị mmadụ nọ n’ụlọmkpọrọ niile dị na Naịjirịa, ma kwuo na ndị a ga-atọhapụ bụ ndị na-enweghi ike ịkwụnwu ụgwọ ngha e tinyere n’isi ha.

Ọ gara n’ihu kwuo na gọọmentị ewepụtala ego dị nde narị naịra ise na nde iri asatọ na ise (N585m) ha ga-eji akwụ ụgwọ dị ndị a n’isi iji tọhapụ ha mmadụ 4,068.

O kwuru na ọ ga-abụ ndị ụgwọ maọbụ ngha dị n’isi ha agaghị akarị otu nde naịra.

O kwuru na ministri na ministri na-ahụ maka ikpe ziri ezi ga-agbakọta aka iji hụụ na e belatara ndị e ji na nga maka na ikpe ha ga-adị n’ụlọikpe kamgbe a kpọrọ ‘awaiting trial’.

Na nzaghachị onyeisi ndị nlekọta ụlọmkpọrọ na Naịjirịa bụ Haliru Nababa kelere minista na-ahụ maka ime obodo n’ihi atụmatụ a.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *