Take a fresh look at your lifestyle.

Ịkagbu visa na Saudi Arabia: Nigeria na-akpọ ka obi dajụọ

0 183

Gọọmenti Naijiria akpọọla ka obi dajụọ maka ịkagbu visa ndị njem Naijiria otu nari iri asaa na asaa bịarutere Jeddah, Saudi Arabia.

GỤKWUO GBASARA YA: Ndị omebe iwu na-enyocha ịkagbu visa ndị ọchịchị Saudi Arabia Akpọrọ oku a na nkwupụta nke ọnụ na-ekwuchitere Mịnịstrị nke Ofesi, Oriakụ Francisca Omayuli bịanyere aka na ya site na njikwa ọrụ X na mgbede Tuzdee,abali iri na ano nke onwa Nọvemba, 2023.

O kwuru na akụkọ sitere na consulate Nigeria dị na Jeddah gosipụtara na ndị njem nari abuo iri isii na ano 264 nọ na ụgbọ elu Air Peace rutere Saudi Arabia na Mọnde abali iri na ato nke onwa Nọvemba 2023.

Ọnụ na-ekwuchitere ya gara n’ihu kọwa na ọ bụ mgbe ha rutere n’ọdụ ụgbọ elu Hajj ka e mere ndị njem otu narị na iri asaa na asaa ka ha ji otu ụgbọ elu lọghachite Naijiria ebe ndị njem iri asato na asaa kpochara ma kwe ka ha bata na Jeddah.

Dị ka ya si kwuo, “Ndị ọchịchị Saudi ka enyebeghị ihe kpatara ịkagbu visa ahụ ma e wezụga (18) nke ndị njem a machibidoro na Saudi Arabia kpamkpam maka mmejọ dị iche iche e mere n’oge gara aga.”

Oriakụ Omayuli kwukwara na nyocha na-aga n’ihu na Naịjirịa na Saudi Arabia

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *