Take a fresh look at your lifestyle.

 Steeti Oyo:Gọọmenti enyela ndị ọrụ ugbo usoro mgbazinye ego.

chigo deziri ya n'igbo.

0 476

Gọọmenti  steeti Oyo enyela ụlọ ọrụ ego nbinye otu ijeri naira na steeti ahụ, n’okpuru mmemme Sustainable Action for Economic Recovery (SAFER), nke a ga-enye ndị ọrụ ugbo nọ na steeti ahụ.
Dotun Oyelade Kọmishọna na-ahụ maka mgbasa ozi na usoro ọmụmụ obodo kwuru na nke a gosiri  oke uru nyee ndi ọrụ ugbo.
Onyeisi oche n’ ihe gbasara ọrụ ugbo na steeti Oyo ,Taofeek Akeugbagold, kwuru na ndị ọchịchị dị ugbu a na steeti ahụ kwadoro  ngbanwee na ngalaba ọrụ ugbo .

Onye isi oche ahụ kwuru na a ga-enye ndị ọrụ ugbo nọ n’okpuru ọchịchị iri atọ na atọ (33) nke steeti ahụ ebe a na-agbazinye ego ka o wee kwalite nchekwa nri na steeti ahụ.

Ịnye ego nke Agricultural Value Chain
N’okwu nke ya, onyeisi ụlọ ọrụ na-ahụ maka ọrụ ugbo bụ Emmanuel Ogundiran kọwara na gọọmentị steeti ahụ eweghachila ụlọ ọrụ ahụ n’isi, ma kọwaa na ụlọ ọrụ ahụ enwetala ego ụfọdụ site n’ikike inye ego n’ụgwọ ọrụ ugbo kpamkpam.
Ogundiran kwuru, sị: “Ụdị  mbinye ego ahụ ga-adị kpọmkwem dị ka e debere ya na ọnọdụ mbinye ego nke ụlọ ọrụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *