Take a fresh look at your lifestyle.

ACCI na-ewepụta mmemme ọzụzụ na injinịa webụ, mmụta maka igwe maka ọdịmma ụmụ akwụkwọ Naijiria.

chigo denwere ya n'igbo.

0 370

ACCI na-ewepụta mmemme ọzụzụ na injinịa webụ, mmụta maka igwe maka ọdịmma ụmụ akwụkwọ Naijiria.

Abuja Chamber of Commerce and Industry Business Entrepreneurship and Skill Technology Center (ACCI-BEST) ekwupụtala mmalite nke usoro ọzụzụ .

Ndị ọchịchị Japan kwadoro mmemme ọzụzụ a site na Association for Overseas Technical Cooperation and Sustainable Partnerships, AOTS nke  ndi ga-erite uru na ya bụ ụmụ akwụkwọ 300 nke Mahadum Abuja na Mahadum Base.

Onye isi oche nke ACCI, Dr. Al-Mujtaba Abubakar, n’oge mmemme mmalite nke emume ahụ, gosipụtara ekele nye gọọmentị Japan maka nkwado.O   kelekwara Mahadum nke Abuja, na Mahadum Baze maka ntinye aka ha na-enweghị atụ iji mejuputa mmemme a maka ọdịmma ụmụ akwụkwọ Naijiria.

Dọkịnta Abubakar gbara ụmụ akwụkwọ ahụ ume ka ha were ohere a dị ịrịba ama mee ka ọrụ ha na uto nke onwe ha gaa n’ihu.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *