Onye isi ala Tinubu kwadoro okporo ụzọ di nari iri abụọ na isi 260 maka ndozi.
Temitope Mustapha, Abuja
Onye isi ala Tinubu kwadoro okporo ụzọ di nari iri abụọ na isi 260 maka ndozi .
Onye isi ala Bola Ahmed Tinubu akwadola mkpokọta okporo ụzọ 260 maka ndozi I na steeti iri atọ na isii na Federal Capital Territory.
Nke a ga-amalite n’ oge ọkọchị kpọmkwem na Nọvemba 2023.
Mịnịsta na-ahụ maka ọrụ na Naịjirịa, Senator Dave Umahi mere ka a mata nke a na Tọzdee ka ya na Onye isi ala nwechara nzukọ.
Mịnịsta ahụ kwuru na Onye isi ala Tinubu kwadoro iru ihe ndi a:
- Akwa mmiri Shendam Lafia nke dara na nso nso a.
- Nrụzi isi iri na asaa n’okporo ụzọ ọwụwa anyanwụ-ọdịda anyanwụ nke idei mmiri mebiri n’etiti afọ 2022-2023.
- Irụzi ya bụ àkwà mmiri abụọ dara n’Enugwu steeti
- Okporo ụzọ Onitsha/Owerri.
- Na-ebe ndi ozo di iche iche na mpaghara Naijiria.
Sinetọ Umahi kwuru na “Ọ bụghị nanị na onyeisiala akwadoghị ụzọ maka nrụzi kamakwa o wepụtara ego iji malite ọrụ ahụ.”
Leave a Reply