Take a fresh look at your lifestyle.

Pope akpọọla ụkọchukwu ụka Katọlik na Gaza, kasie ya obi dịka ọgụ ka na-ada

0 359

Pope Francis akpọọla ụkọchukwu na-elekọta ndị ụka Katọlik na Gaza bụ ụkọchukwu Gabriel Romanelli iji kasie ya obi maka ọgụ na-aga n’ihu na mpaghara ahụ ugbua.

Romanelli kwuru na Pope Francis gwara ya na ọ na-ekpe ekpere “ka udo chịa n’etiti Israel na Palestine”, nakwa “ka mwakpo nke egbe na ogbunigwe dajụọ”, n’ihi na “iyi ndụ egwu na agha agaghị eweta ogbugbo ọbụla”.

Ụkọchukwu ahụ kwueu na Pope Francis kpọkwara ya ụnyaahụ iji jụọ ese etu ndị ụka ya si eme.

Ka ọ dị ugbua, ụkọchukwu ahụ kwuru na ya tọrọ atọ na Bethlehem ebe ọ gara ịụta ọgwụ na ihe ndị ọzọ maka ndị ụka ya, mana ya enwenwughị ike ịlaghachi Gaza.

O kwuru na ihe ruru mmadụ otu nari na iri ise gbara ọsọ ndụ nọ n’ụlọụka ya ugbua na-ezere ndụ.

Ihe ruru mmadụ puku atọ anwụọla n’ọgụ a dapụtara n’etiti Hamas na Israel dịka ndị otu Hamas, bụ otu ndị ọgụ alakụba na mba Palestine wakporo Israel site na mpaghara Gaza n’ụbọchị Satọde.

N’ụbọchị Sọnde, Pope Francis kwuru na obi ya na-agara ndị niile ọgbaaghara ahụ metụtara nakwa ndị na-agabiga ihe egwu na nnukwu nhịahụ.

“Onweghị onye na-emeri n’agha ọbụla,” Pope Francis kwuru na mgbasaozi ahụ. “Ka anyị na-ekpe ekpere maka udo n’Israel na Palestine.”

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *