Take a fresh look at your lifestyle.

APC Bayelsa ga-agbagha nchụpụ Timipre Sylva n’ụlọikpe mkpegharị

0 225

Otu ndọrọndọrọ ọchịchị ‘All Progressives Congress’ nke Bayelsa Steeti ekwuola na ha ga-aga ụlọikpe mkpegharị iji gbaghaa mkpebi nke ụlọikpe ukwu dị n’Abuja nyere bụ nke kwuru na Timipre Sylva agaghị eso zọọ ntuliaka ọkwa gọvanọ steeti ahụ.

Ọnụ na-ekwuru APC Bayelsa steeti bụ Perry Tukuwei kwuru na onye wegara mkpesa ahụ n’ụlọikpe bụ Demesuoyefa Kolomo abụghị onye APC kama ọ bụ ory ‘Peoples Democratic Party’.

Tukuwei kwukwara na oge agafeela e kwesịrị iji weta mkpesa ọbụla megide ndị na-azọ ntuliaka, maka na iwu Naịjirịa kwuru na mkpesa ọbụla kwesịrị irute ụlọikpe aka n’ime ụbọchị iri na ano Inec ji wepụta aha ndị kwesiri iso zọọ ntuliaka.

“Inec wepụtara aha ndị ga-eso zọọ ọkwa gọvanọ na Bayelsa, Imo na Kogi Steeti n’abali iri na otu nke ọnwa Mee 2023, mana Kolomo wegara mkpesa ya n’ụlọikpe n’abali iri na ato nke ọnwa June 2023. Nke a pụtara na oge iwu nyere maka mkpesa dị etu a agafeela,” Tukuwei kwuru.

Ọ gara n’ihu kwukwaa na ụlọikpe kachasị enyela iwu na ikpe niile gbasara ntuliaka ga-abụ na steeti ebe a nọrọ mee ntuliaka ka a ga-anọ kpee ikpe ya, “mana iji gosi na ndị mere mkpesa a bu ihe ọjọọ n’obi, ha wegara ikpe a n’Abuja. Abuja ọ bụ Bayelsa?”

Tukuwei kwuru na ha enyela ndị ọkaiwu ha iwu ka ha gbaghaa mkpebi ụlọikpe ahụ n’ụlọikpe mkpegharị iji kụchapụ ya.

Ihe mere ụlọikpe ji kwuo na Timipre Sylva agaghị eso zọọ ọkwa gọvanọ na Bayelsa

Ụlọikpe ukwu dị n’Abuja achụpụla Timipre Sylva dịka onye ga-eji ọkọlọtọ otu ndọrọndọrọ ọchịchị ‘All Progressives Congress’ (APC) zọọ ọkwa gọvanọ Bayelsa Steeti na ntuliaka a ga-eme n’abali iri na otụ nke ọnwa Nọvemba.

Ọkaikpe Donatus Okorowo nyere mkpebi a n’ụbọchị Mọnde, dịka otu onye APC aha ya bụ Deme Kolomo wegara mkpesa n’ụlọikpe ma kwuo na Sylva ekwesịghị iso zọọ ọkwa gọvanọ ọzọ.

Ụlọikpe ahụ kwuru na e duola Timipre Sylva n’iyi ọrụ dịka Gọvanọ Bayelsa Steeti ugboro abụọ, nke pụtara na ọ bụrụ na o merie ntuliaka nke afọ a, ọ ga-abụ nke ugboro atọ a ga-edu ya n’iyi ọrụ dịka gọvanọ, mana iwu Naịjirịa kwuru na ọ bụ naanị ugboro abụọ ka mmadụ nwereike ịbụ gọvanọ steeti.

Ọkaikpe Okorowo kwukwara na mgbakọta afọ niile Sylva rụrụla ọrụ dịka gọvanọ Bayelsa Steeti bụ afọ ise, nke pụtara na ọ bụrụ na o merie ntuliaka nke ọnwa Nọvemba 2023, ma gaa n’ihu bụrụ gọvanọ ruo afọ anọ, ọ ga-eweta mgbakọta afọ niile ọ rụrụ ọrụ dịka gọvanọ ruo itoolu, mana iwu Naịjirịa kwuru na mmadụ agaghị abụ gọvanọ steeti karịa mgbakọta afọ asatọ.

Cheta na Sylva achịbuola Bayelsa Steeti dịka gọvanọ. O meriri ntuliaka nke mbụ ya n’abali iri na ano nke ọnwa Eprel afọ 2007 n’otu ndọrọndọrọ ọchịchị ‘Peoples Democratic Party’ (PDP), e duo ya n’iyi ọrụ n’ụbọchị iri abuo na itolu nke ọnwa Mee afọ ahụ.

Mana otu onye so zọọ ntuliaka ahụ bụ Ebitimi Amgbare nke pati ‘Action Congress (AC) mere mkpesa n’ụlọikpe, nke mere ka ụlọikpe mkpegharị kagbuo ntuliaka ahụ nakwa mmeri nke Sylva meriri, ma nye iwu ka onyeisi ụlọ omeiwu Bayelsa n’oge ahụ bụ Werinipre Seibarugo bụrụ gọvanọ steeti ahụ nke nchereoge.

N’ụbọchị 24 nke ọnwa Mee afọ 2008, e mere ntuliaka ọzọ dịka ụlọikpe si nye iwu, Timipre Sylva emerikwaa. E duru ya n’iyi ọrụ nke ugboro abụọ n’abali iri abuo na asaa nke ọnwa Mee afọ ahụ.

Ọ bụ nke a mere ụlọikpe ji kpebie na e duola Sylva n’iyi ọrụ ugboro abụọ nke bụ ugboro ole iwu Naịjirịa kwuru na a ga-edu mmadụ n’iyi ọrụ dịka gọvanọ.

O dobeghị anya ma Sylva a ga-agbagha mkpebi a n’ụlọikpe mkpegharị.

Sylva arụkwaala ọrụ dịka Mịnịsta nta na-ahụ maka mmanụ agbịdị bido n’ọnwa Ọgọst 2019 ruo Maachị 2023.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *