Take a fresh look at your lifestyle.

Neco ewepụtala mpụtara ule SSCE nke afọ 2023

0 226

Ụlọọrụ ‘National Examination Council’ (Neco) ewepụtala mpụtara ule ‘Senior School Certificate Examination’ (SSCE) nke afọ 2023.

Onye ji ọkwa Registrar na Neco bụ Dantani Wushishi kwuru na mpụtara ule nke afọ a so na nke kacha mma na nsonso a.

Wushishi kwuru na ọnụọgụgụ ndị denyere aha maka ile ule Neco n’afọ a dị 1,205,888, mana ndị lere ya bụ ule dị 1,196,985 n’ọnụọgụgụ. Ụmụnwoke dị n’ọnụọgụgụ a dị 616,398 ebe ụmụnwaanyị dị 580,587.

N’ime ọnụọgụgụ a, mmadụ 737,308 nwetara akara ‘credit’ na ngalaba ọmụmụ ise, nke gụnyere asụsụ bekee na mgbakọ na mwepu.

Nke a pụtara na ndị mere nke ọma n’ule nke afọ a bụ pasentị 61.60 ndị niile lere ya bụ ule.

Wushishi kwukwara na ọnụọgụgụ ụmụakwụkwọ achọpụtara na ha mere mpụ ule n’ụzọ dị icheiche dị puku 12,030, nke bụ pasentị 0.07 ndị niile lere ule ahụ.

Etu ị ga-esi chọpụta mpụtara ule Neco gị

  1. Gaa na websaịt Neco bụ: https://results.neco.gov.ng/
  2. Họrọ ụdị ule nke i lere nakwa afọ i lere ya
  3. Tinye akara pụrụ iche nke ụlọọrụ Neco ziteere gị n’ekwentị
  4. Tinye akara ule gị
  5. Pịa aka n’ebe e dere “Check my result”

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *