Ndị agha Israel na-ebu agha ugbua ikpochapụ ndị ọgụ si na mpaghara Gaza nke mba Palestine wakpo mba ha n’ụbọchị Satọde, dịka otu Hamas sikwa na Gaza na-atụba ogbunigwe n’ime Israel.
Ka ọ dị ugbua, akụkọ na-ekwu na ọnụọgụgụ ndị Israel nwụrụla na mwakpo ahụ akarịala nari isii.
Ndị nwụrụ na Gaza akarịkwaala nari ato na iri asaa dịka Israel busokwara mba Palestine agha site na mpaghara ahụ, ebe ndị agha Israel na-ekwu na ha egbuola ndị ọgụ Palestine ruru nari ano ma jidekwa ọtụtụ.
Mwakpo nke ụbọchị Satọde bụ ụbọchị a kacha kwafuo ọbara na mba Israel kamgbe ọgbaaghara mere ebe ahụ n’afọ iri ise gara aga n’ụbọchị emume Yom Kippur.
Ihe ise merela kamgbe Hamas wakporo mba Israel
Ọ karịala awa iri abuo na ano ugbua kamgbe otu ọgụ mba Palestine bụ Hamas wakporo mba Israel n’ụdị a na-ahụbeghị atụ ya mbụ.
Kamgbe ahụ, ọtụtụ ihe gbara ọkpụrụkpụ emeela dịka otu abụọ a na-aga n’ihu ibuso onwe ha agha. Lee ise n’ime ihe ndị merelanụ:
1) Ihe karịrị mmadụ nasị asatọ anwụọla
Opekatampe, ndị Israel 500 anwụọla kamgbe mwakpo a malitere, ebe ihe karịrị mmadụ 2000 ọzọ merụrụ ahụ ma na-anata ọgwụgwọ n’ụlọọgwụ – iri na itolu ka mmerụahụ haburu ibu.
N’aka nke ọzọ, ndị Palestine ruru nari ato iri na ato anwụọla ugbua, ebe 2000 merụrụ ahụ na mpaghara Gaza, dịka mba Israel wakpokwara mpaghara ahụ.
Ndị ọgụ Hamas sị na ha jidere ọtụtụ ndị agha na ndị nkịtị ndị Israel bụ ndị ha kpụụrụ gaa Gaza.et
2) Aghaa ga-esi ike, tee aka
Praịm Mịnịsta mba Israel bụ Benjamin Netanyahu agwala ndị mba ya na “agha a ga-esi ike ma tekwaa aka”.
Na mgbasaozi o mere n’abalị ụbọchị Satọde, Netanyahu kwuru na “ọ bụ ndị ogbu mmadụ bụ otu Hamas manyere ha ịlụ agha a.
O kwere nkwa na agba nke mbụ nke agha a ga-ebi n’oge adịghị anya dịka ha ga-ekpochapụ ndị ọgụ nnupuisi batara n’ime oke ala Israel.
Gọọmentị Israel kwuru na ha akụchapụla ọkụ latrik na mmanụ ụgbọala bụ nke ha na-enyebu mpaghara Gaza.
3) Mpaghara asatọ ka ọgụ na-aga
Ndị agha mba Israel kwuru na ọ ka ruru mpaghara asatọ ha si ebuso ndị ọgụ Hamas agha n’ime Israel.
Cheta na ndị agha Hamas si Gaza bata n’ime mpaghara dị icheiche n’Israel wee malite mwakpo a.
Ndị agha Israel kwuru na ha ewegharala mpaghara ruru iri abuo na abuo bụ ebe ndị Hamas sibu wakpo ha, mana ọgụ ka na-aga n’ihu ugbua na mpaghara ndị ọzọ n’ime Israel.
4) Ụlọ ndị isi Hamas, ụlọakụ…socha n’ebe Israel wakporo
Ụfọdụ ndị Palestine gbagara ọsọ ndụ n’ụlọakwụkwọ nke otu UN nwe
Ụgbọelu agha mba Israel atụọla ogbunigwe n’ebe ruru otu nari na iri iae kamgbe ha malitere ibusokwa mba Palestine agha na Gaza, dịka ndị ma ihe na-emenụ si gwa ndi nta akuko.
Ebe ndị a gụnyere ụlọ nke e chere na ọ bụ ebe ndị isi Hamas bi. Ndị agha elu Israel kwukwara na ha tụrụ ogbunigwe n’ụlọakụ abụọ bụ nke ha sị na “ha so n’ebe ndị ọgụ Hamas si enweta ego ha ji alụ ọgụ”.
Ha kwukwara na ha gbariri otu ebe a na-arụpụta ngwaọgụ nke ha sị na ọ bụ otu ọgụ ‘Islamic Jihad Terroris Organisation’ nwe ya (otu a dị iche na Hamas).
Ụlọ ọzọ nke nwere ụlọọrụ dị icheiche na ụlọ nchekwa ihe sokwa n’ebe ndị agha Israel tụrụ ogbunigwe, dịka ha kwuru na ọ bụ ebe ndị Hamas na-edebe ngwa agha ha.
Otu ‘Hezbollah’ nke mba Lebanon esonyela ọgụ a
Ogbunigwe nke Hamas gbabanyere n’ime mba Israel n’abalị asaa nke onwa Ọktoba
Otu ndị ọgụ nnupisi nke mba Lebanon bụ Hezbollah esonyerela ndị Hamas n’ibuso Israel agha. Ha kwuru na ọ bụ ha tụrụ ogbunigwe na Mount Dov, ala nke Israel, Lebanon na Syria na-azọ azọ, mana ọ bụ Israel nọ ọnọdụ ebe ahụ.
Ha kwuru na ha tụrụ ogbunigwe a iji gosi nkwado ha maka ọgụ Palestine na-aluso Israel.
Iji bọọ ọbọ maka nke a, ndị agha Israel tụrụ ogbunigwe na mba Lebanon, n’otu ụlọ dị na mpaghara Rus nke a sị na ọ bụ Hezbollah nwe ya.
Okeala dị n’etiti Israel na Lebanon dara jụụ kamgbe Israel na Hezbollah lụchara agha na 2006. Mana esemokwu n’etiti ha abụọ na-agbali elu n’ọnwa olemole ugbua.
Israel Attack: E gbuola ndịagha nnupụisi Palestine nari ano
E gbuola ihe karịrị ụmụafọ Izrel nari ise kemgbe ndị agha nnupụisi Hamas wakporo Mba Izrel ụbọchị Satode.
Hamas bụ otu agha nnupusi Jihad mba Palestine bụ ndị weghara ọchịchị na ‘Gaza Strip’ kemgbe afọ 2007 bụ ndị wakporola Izrel ụgbọro ugboro dịka ha ụṅụrụ ikpochapụ Izrel.
Ndiagha Izrel jikwara ogbunigwe ha na-atụ n’elu gbuo ihe karịrị ndị Palenstine karịrị mmadụ nari ano.
Mmadụ ruru puku abuo merụkwara ahụ. dịka Ministrị ahụike ha si kwuo.
Ọgụ na-akawanye njọ na mpaghara ahụ, dịka ndịagha mba Izrel na-agbalị napụkwa ebe ndị Hamas weghaara.
Ndịagha Izrel na ndị agha nnụpụisi Palestine na-akwata na mpaghara dị iche iche n’ Ọdịda Anyanwụ Izrel, dịka ụfọdụ ụlọakụkọ mpaghara ahụ si kwuo.
Haaretz kwuru n ndị agha Izrel siri na ha ewerekwala ọnọdụ n’ọtụtụ ebe n’ọdịda Anyanwụ mba ahụ ma na-aga n’ihu ịlụ ọụ inweta ebe nile dị nso okeala Gaza gụnyere Be’eri na Sderot.
Dịka ụlọ ntaakụkọ ‘Times of Israel’,si kwuo, ọnụ na-ekwuru (Israel Defence Firces (IDF)gbara ama na e gbuola ihe karịrị ndịagha nnụpụisi Palestine 400 ma nwụchikwaa ọtụtụ ndị ọzọ.
N’aka nke ọzọ, Ministrị ahuike mba Izrel kwuru na o pekata mpe, e gbuola ụmụafọ Izrel nari ato na iri ise, e be a tọọrọ ọtụtụ.
Ụlọọrụ nnọchiteanya Izrel na mba Briten kwurukwara na ọ bụ eziokwu na otu nwa afọ Briten a kpọrọ Jake Marlowe na-efu efu.
Marlowe na-arụ ọrụ nchekwa na’ebe a na-eme emume ịgba egwu dị nso n’okeala Gaza oge mwakpo ahụ mere ụbochị Satode mere.
Israel nọ n’agha dịka e gburula ihe ruru mmadụ otu nari – Praịm Minista
E gbuola ihe ruru mmadụ 100 n’Isreal mgbe ndị ekperima si mba Palestine a kpọrọ Hamas wakporo ha n’ụzọ kachasị kamgbe ọtụtụ afọ.
Ndị ekperima a batara n’obodo Isreal site n’obodo Gaza dịka ha na-atụ nnukwute ogbunigwe ma tọọrọ ọtụtụ ụmụafọ mba Isreal.
Ndị ha tọọrọ gụnyere ndịagha na ndị nkịtị bụ ndị ha duu laghachị n’obodo Gaza.
Mba Izrel malitere ịtụ mgbọ elu na Gaza iji zaghachi mwakpo a mere na be ha.
Izrel ekwukwuola na ha “nọ n’agha” dịka ọtụtụ ndị ojiegbe si n’otu oyinduegwu nke Palestine a kpọrọ Hamas bata be site n’ụzọ Gaza.
Nke a mere n’ụzụ ụtụtụ dịka ha kwaturu obere ohere n’ọgba aja n’ebe ahụ
Praim Minista mba Israel eforola ntutu taa na Hamas “ga-akwụ ụgwọ ha akwụtụbeghi mbụ” maka ihe a mere.
Otu onye mba Izrel nwụrụ n’aka ndị ojiegbe Hamas ebe ogbunigwe gburu otu onye ọzọ ma merụọ narị kwuru narị ahu.
Ihe mere Hamas ji wakpo Izrel
Onyeisi otu Hamas but Mohammed Deif ekwetala na ọ bụ otu ya gbara ogbunigwe puku ise n’ime nkeji iri abuo n’atumatu a kpọrọ Al-Aqsa storm.
Ọ kwuru si “anyị kpebiri na ozuola bụ na o zuola”
“Anyị adọbuola ndị ilo aka ná ntị. Ha emejọọla anyị n’ọtụtụ ụzọ. Narị kwuru narị n’ime ndị otu anyị anwụọla n’aka ndị nọchiri anyị
“Anyị na-ezipu ozi maka mbido Al-Aqsa flood, ma kwukwaa na mwakpo nke mbụ anyị nke chere ihu n’ọnọdụ ndị ilo gụnyere ọdọ ụgbọ elu nakwa ogige ndị agha gafere ogbunigwe puku ise”
Ogbunigwe ndị a tụrụ si na Gaza bụ ebe Hamas nọ n’ọchịchị malitere n’ụzụ ụtụtụ ụbọchị Satọde dịka ndị Jew na-eme emume okpukperechi ha akpọrọ Simchat Torah.
Mịnịsta na-ahu maka ahụike na mba Isreal kwuru na ihe ruru mmadu nari asaa na iri ano merụrụ ahụ n’nwakpo Hamas.
N’otụtụ awa ka ụloọrụ mgbasaozi TV nke Isreali agbaala ọtụtụ ndị tọọrọ n’ụlọ ha ajụjụ ọnụ mgbe ekperima Palestine wakporo obodo ha.
Ndị bị n’obodo ahụ kwụrụ na ihe dị etu ahụ emetụbeghị kamgbe ọtụtụ afọ, ebe a gbachiela okporoụzọ dị n’isiobodo Tel Aviv dịka ebe niile tọgbọ chakoo.
Ọdeakwụkwọ bekee bụ Gideon Levy, gwara ndi ntaakuko na emechiela ọtụtụ ebe mgbakọ, ụjọ na atụ ndịmmadu maka ịhe nwere ike ị me na ọdị n’ịrụ.
‘’Ana m agba ọsọ mgbe ogbunigwe nke mbu dara, mkpọtụ ya dị egwu.”
E gburu onyeisi okpuruchichị dị na mpaghara South bụ Ofir Liebstein, mgbe ha ndị ekperima a na-akwarịta mgbọ oge ọ gara inye aka chekwaa obodo ya
Mgbochi ụzọ ahụ gara n’ihu ruo ụtụtụ Satọde dịka ọtụtụ a tụrụ ọtụtụ ogbunigwe nke chere ihu na mba Isreal. Ụlọọgwụ dịcha n’obodo Ashkelon na n’etiti obodo Beer Sheva na-agwọ ndị merụrụ ahụ.
“Ụmụafọ Isreal, anyị nọ n’agha, ọ bụghị obere mwakpo, mana ọ bụ agha.” Ka Praịm minista Netanyahu kwuru.
“Akpọkuola m ndịisi nchekwa ma sị ha buru ụzọ dupu ndị bi n’ime obodo ebe niile ndị ekperima a batarala. A na-eme nke a ugbua.
“N’otu aka ahụ agwala m ha ka ha were otu aka ikike ahụ ndị a jiri wakpoo anyị ma wakpoo ndị iro anyị.”
Otu onye welitere isi na ndị agha Hamas kwupụtara mmalite atụmatụ a na mgbasaozi o mere, na-akpọku ndị Palestine nọ ebe niile ka ha lụọ ọgụ.
“Taa bụ ụbọchị a ga-ebu agha kachasị iji kwụsị nnọchi ala nke ikpeazụ n’ụwa,” Mohammed Deif kwuru.
Onyeisiala mba Palestine bụ Mahmoud Abbas – onye ya na otu Hamas – haziri ọgbakọ gbatagbata, ebe ọ nọrọ kwuo na ndị Palestine nwere ikike ichekwa onwe ha n’ihi”iyi egwu na mwakpo nke ndị agha bịara iweghara ala ha.”
Amalitela nnukwu nnyocha iji mata etu ndị agha Israel si ghara ịchọpụta màkà mwakpo a nke Hamas wakporo ha, ndị ọchịchị Israel gwara BBC.
Mba ụwa dị icheiche akatọọla mwakpo a Hamas mere. James Cleverly, ji ọkwa ‘Foreign Secretary’ na mba UK kwuru na gọọmenti UK katọrọ mwakpo nke Hamas wakporo ndị nkịtị n’Israel, kwukwaa na UK ga na-akwado ikike dịịrị mba Israel ichekwa onwe ya.
Otu Nato katọkwara mwakpo ndị ahụ bụ nke ha kpọrọ mwakpo iyi ndụ egwu nke Hamas mere megide Israel.
Onyeisi otu European Commission bụ Ursula von der Leyen kọwara mwakpo ndị ahụ dịka “ụdị iyi ndụ egwu kacha njọ” – ebe mba Amerịka kwuru na ha “ga agba mbọ ihụ na Israel nwere ihe niile dị ha mkpa iji chekwaa onwe ha”.
Leave a Reply