Take a fresh look at your lifestyle.

Ndị dọkịta ahụla okpo dị ndụ n’ime ụbụrụ otu nwaanyị na mba Australia, ogologo okpo ahụ ruru 8cm (3in).

CHIGO DERE YA,

0 456

Ndị dọkịta ahụla okpo dị ndụ n’ime ụbụrụ otu nwaanyị na mba Australia, ogologo okpo ahụ ruru 8cm (3in).

Nke a bụ nke mbụ a na-ahụ ụdị ihe dị otu a na mmụta ahụike n’ụwa niile.

Hari Priya Bandi bụ dọkịta chọpụtara ihe a kwuru na nwaanyị ahụ nwere ngosipụta ọrịa d icheiche nke gụnyere afọ mgbu, ụkwara, okpofufu abalị, nchefu ihe, na obi ịda mba.

A nabatara nwaanyị ahụ n’ụlọọgwụ na ngwụcha ọnwa Jenụwarị afọ 2021, mana nnyocha gosiri na e nwere ihe metụtara ihu ụbụrụ ya.

Amataghị kpọmkwem ihe kpatara nke a mana ọ bụ n’ọnwa June afọ 2022 dịka a wara nwaanyị ahụ ụbụrụ ka Dkt Bandi hụrụ ihe gbara ya gharịị.

A chọpụtara na okpo ahụ na-acha mmeemmee anọọla n’ime ụbụrụ nwaanyị ahụ ihe ruru ọnwa abụọ.

“Oge m hụrụ ya, ọ gbara m gharịị, m were ‘tweezer’ m kpapụta ya ma hụ na ọ dị ndụ na-akpagharị,”dkt Bandi kwuru.

“Ọ tụrụ onye ọbụla n’anya dịka okpo ahụ na-akpagharịrị onwe ya oge anyị wepụtara ya n’ime ụbụrụ nwaanyị ahụ.

Ndị ọkachamara n’ọrụ ahụike na-ekwu na nke a bụ a na-ahụ ihe yiri ‘larvae’ n’ime ụbụrụ mmadụ dị ndụ.

BBC IGBO

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *