Take a fresh look at your lifestyle.

Niger Coup: Onyeisiala Mohamed Bazoum nọ n’ọnọdụ ‘Obi ụtọ’ agbanyeghi na e ji ya eji

0 410

Dọkịnta onyeisiala Niger kwuru na ọ nọ “n’ọnọdụ obi ụtọ’ agbanyeghi na ndịagha Niger weghaara ọchịchị ji eji tinyere ya n’ọnọdụ “na-adịghị mfe ịnọ”.

O kwuru nke a dịka o zutechara ya.

Kemgbe abali iri abuo na isiiew nke ọnwa Jụlaị bụ ụbochị ndịagha a weghaara ọchịchị na mba a, ha tinyere Mohamed Bazoum, nwunye ya na nwa ya nwoke n’okpuru ụlọ obi gọọmentị ya dị na Niamey.

O gwara ụlọ ntaakụkọ mba France a kpọrọ RFI na “Ọnọdụ e tinyere ya bụ ọnọdụ na-adịghị mfe ịnọ dịka enweghi ọkụ latrịk nọ ebe ahụ ma ncha”.

Ndịagha a mechara kwee ka dọkịnta ya bịa hụ ya dịka ọtụtụ ndị ọchịchị na mba ofesi dị iche iche na-akpọ oku ka atọhapụ ya.

Ụlọntaakụkọ RFI kwuru na nke a bụ mbụ a na-ekwe onye ọbịa ọbụla izute Bazoum kemgbe ndịagha weghara ọchịchị ebe ahụ.

E kwuru na Bazoum dị afọ iri isii na ato a bụrụla onye tara oke ahụ ugbua n’ụzọ ‘dị oke egwu’ dịka e kwebeghi nwa ya nwoke dị afọ 20 nke nwere ezigbo ọrịa ọjọọ ka ọ hụ dọkịnta ọbụla.

RFI kwuru na “Dọkịnta a nwereike kwuturu onyeisiala, nwunye ya na nwa ya nwoke”.

“O kwuru na ihe niile na-aga nke ọma dịka dọkịnta ahụ wetere ha nri na ọgwụ”.

Ụlọntaakụkọ ahụ kwukwara na ka dọkịnta a gachara zute ha na ezinaụlọ ya kwuru na obi ha koburu n’elu ekudaala.

A na-eche na ndịagha a weghaara ọchịchị Niger nke ọchịagha Abdourahmane Tchiani na-edu kpebiri ikwe dọkịnta a ka ọ bịa hụ onyeisiala maka etu ọtụtụ ndị mmadụ si akatọ njibodo ya nke ha mere kemgbe ha weghara ọchịchị.

Onyeisi ọrụ ikike dịrị onye n’ụlọọrụ UN bụ Volker Turk kwuru na na ọnọdụ e tinyere abụghị ọnọdụ e kwesịrị itinye mmadụ n’ime ya ma kwuo na ọ bụ ọnọdụ na-akwanyeghịrị ya ugwu dịka o kwuru na nke a megidere iwu ikike dịrị onye nke mbụ ụwa.

Zazia bụ nwa ya nwaanyị dị afọ iri ato na ano onye nọ njem ezumike na mba France mgbe ndịagha weghara ọchịchị Niger gwara ụlọ ntaakụkọ Guardian n’izuụka a na nna ya, nne ya na nwanne ya nwoke enweghi mmiri ọṅụṅụ dị ọcha ịnụ, ha enweghi ọkụ latrịk dịka a na-enye naanị osikapa na nrị ‘pasta’ ka ha rie kemgbe ahụ.

O kwuru na nri ndị nọ n’ime igwe ntụ oyi ha amalitela imebisi n’ihi na ọkụ latrịk anọghị ebe e tinyere ha.

N’agbanyeghị etu e siri jibido ya, Maazị Bazoum nwereike bipụta ozi site n’aka ụlọntaakụkọ Washington Post ebe o kwuru na ọ bụ onye e ji eji ma kwukwaa na mweghara ọchịchị a na-eme a “ga-emetụta mba anyị, mpaghara anyị na ụwa dum n’ụzọ jọgburu onwe ya”.

Ọ karịala otu izuụka kemgbe Onyeisiala mba Amerịka bụ Joe Biden kpọrọ oku ka a tọhapụ Maazị Bazoum “ngwa ngwa” maka atụmatụ “nchekwa ọchịchị onye kwuo uche ya gbasiri ike na Niger”.

Nke a so ozi ịdọ aka na ntị ruru abalị asaa otu jịkọrọ mba Ọdịda Anyanwụ Afrịka bụ Ecowas nyere ka ndịagha tinyeghachi ọchịchị onye kwuo uche ya na mba ahụ.

Ecowas dọrọ aka na ntị na ha ga-eziga ndịagha ha ebe ahụ maka atụmatụ imanye ndị a ka ha mee ihe ha chọrọ mana ha mechara ghara ime nke a dịka ndịagha a weghara ọchịchị leghara ozi ha nakwa oku ha na-akpọ ka atọhapụ Bazoum anya.

N’ụbọchị Satọdee, Ecowas kwuru na ha na-atụ anya iziga kọmịtiị ha ka ha gaa mba Niger gaa zute ndịagha a weghara ọchịchị.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *