Take a fresh look at your lifestyle.

Mbido ọbara mgbali elu na ndu mmadu na-emebi ihe.

chigo.

0 226

Mbido ọbara mgbali elu nan du mmadu na-emebi ihe.

A chọpụtara na ọbara mgbali elu na-eme ndị dị afọ 30 ruo afọ 53, butere mmebi okporo ọbara na-agba n’ahụ maọbụ “obere mkpọnwụ ahụ” oge ndị mmadụ ruwere ebe afọ 70.

Ọkammụta Jonathan Schott, onye ọrụ ya bụ inyocha ụbụrụ isi mmadụ na UCL Queen Square Institute of Neurology, du ndị mere nnyocha a.

O kwuru sị “Ọbara mgbali elu, ọbụladị oge anyị dị afọ 30, nwereike inye ụbụrụ mmadụ nsogbu mgbe afọ iri anọ gachara. Nnyocha na mgbochi e ji elekọta ahụike ụbụrụ mgbe onye kawara nka, kwesịrị ịmalite ebe etiti ndụ mmadụ.”

Paul Leeson, onye bụ ọkammụta n’ihe gbasara nlekọta ọrịa obi na mahadum Oxford, kwuru: “O teela anyị matara na ụfọdụ ndị nwere ọbara mgbali elu na-emecha nwee mgbanwe n’etu ụbụrụ ha dị.

“Ihe ndị dọkịta na-arụrịtaụka maka ya kemgbe bụ ma ilekọta ọbara mgbali elu n’ahụ ndị ntoroobịa ọ na-egbochi mgbanwe ụbụrụ ndị a.

“Ihe ọzọ a ga-emenwu bụ nke anyị na-emekarị ugbua, bụ ichere ruo mgbe onye kataturu obere, ibido na-enyocha ọbara mgbalie elu makana anyị ma na mgbe ahụ, mgbanwe ụbụrụ isi amalitela n’ike n’ike.”

Bbc igbo

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *