Take a fresh look at your lifestyle.

Gọọmentị Akwa Ibom na ‘Innoson’ ejikọọla aka iji nye ‘palliative’ maka mwepụ ‘subsidy’

chigo.

0 333

Gọọmentị Akwa Ibom na ‘Innoson’ ejikọọla aka iji nye ‘palliative’ maka mwepụ ‘subsidy’

Gọvanọ Akwaibom Steeti bụ Umo Eno na ụlọọrụ Innoson, bụ ndị na-arụpụta ụgbọala, ejikọọla aka iji belata nhịahụ ndị mmadụ na-agabiga na steeti ahụ n’ihi mgbali elu ọnụahịa mmanụ ụgbọala.

N’ụbọchị Tọzde, Gọvanọ Eno kwuru na gọọmentị Akwa Ibom na ụlọọrụ Innoson ga-ejikọ aka iji belata ahụhụ ndị mmadụ na-ata gbasara ime njem oke ọnụ ugbua.

Ụlọọrụ Innoson na-arụpụta nnukwu ụgbọala ‘bus’ bụ nke na-eji ikuku gaasị pụrụ ije a kpọrọ ‘Compressed Natural Gas’ agba, kama mmanụ ụgbọala bụ fuel.

Ndị ọkachamara na-ekwu na CNG ka mma maka ịdị ọcha gburugburu karịa ‘petrol’, ma dịkwa ọnụala karịa ya.

Nke a na-abịa dịka ndị ọ kacha mara na ekwu ka gọọmentị etiti na nke steeti dị icheiche wepụta atụmatụ njem okporoụzọ nke ndị mmadụ agaghị na-akwụ nnukwu ụgwọ iji mee njem.

Mgbalielu ọnụahịa mmanụ ụgbọala na-abịa dịka gọọmentị etiti kwụsịrị ịkwụ ụgwọ ha na-akwụbu iji butuo ọnụahịa ya, bụ nke a kpọrọ ‘fuel subsidy’ na bekee.

Nke a mere ka ọnụahịa njem ụgbọala nakwa ihe ndị ọzọ niile rịa oke elu nke butere nnukwu nhịahụ.

Gọọmentị etiti wepụtaburu atụmatụ ikesa ezinụlọ ruru nde 12 bụ ndị dara oke ụbịam ego dị puku naịra asatọ kwa ọnwa ruo ọnwa isii, dịka ihe enyemaka.

Mana ha mechara kagbuo atụmatụ ahụ dịka ọtụtụ katọrọ ya, ma kwuo na ọ ka mma itinye usoro ga-ebelata ego ndị mmadụ na-emefu n’ime njem, karịa inye ndị mmadụ ego bụ nke na-enwghị ihe ọbụla ọ ga-ezu iji mee.

bbc igbo

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *