Take a fresh look at your lifestyle.

Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ agaghị eto ma ewepụ Anambra – Alex Otti

chigo.

0 407

Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ agaghị eto ma ewepụ Anambra – Alex Otti

Gọvanọ Abia Steeti bụ Alex Otti esorola kpọọ oku ka ndị Igbo bụ ndị oji ego achụ ego hibe ụlọọrụ nakwa ụlọ ahịa na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa iji kwalite ọnọdụ akụnụba mpaghara ahụ.

Otti kwuru nke a dịka o sonyere n’ọgbakọ nke ndị Gọvanọ Anambra Steeti bụ Chukwuma Soludo kpọrọ maka ndị Anambra Steeti niile bi n’Abuja.

Soludo kpọrọ ọgbakọ a iji kọwaara ndị steeti ya nọ n’Abuja achụ ego maka atụmatụ niile nke ọchịchị ya na-etinye iji kwalite ọnọdụ akụnụba n’Anambra Steeti.

Gọvanọ Otti sonyere n’ọgbakọ a dịka otu n’ime ndị gọvanọ steeti ise mebere mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa, nakwa onye so agba mbọ ịkwalite ọnọdụ akụnụba na mwulite mpaghara ahụ.

“Ihe m ji bịa n’ọgbakọ a bụ iji kwadoo ihe Gọvanọ Soludo na-eme. Anyị niile bụ otu ndị. Ọ dị mkpa ka anyị mezie mpaghara Ọwụwa Anyanwụ; Ọwụwa Anyanwụ agaghị eto ma ewepụ Anambra Steeti. Anyị ga-eme ihe niile anyị nwereike iji mee ka akụnụba lọtaruo ụlọ,” Otti kwuru.

bbc igbo

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *