Take a fresh look at your lifestyle.

NLC akatọọla atụmatụ usoro nkesa ihe enyemaka nke gọọmentị etiti wepụtara

0 262

Otu jịkọrọ ndị ọrụ na Naịjirịa bụ Nigeria Labour Congress (NLC) ewepụtala ozi n’ụbọchị Tuzde katọọ atụmatụ gọọmentị etiti iji ego ruru ijeri narị 500 zụta ihe enyemaka a ga-ekesa nye ndị na-enweghi ka ọ hara ha n’akụkụ Naịjirịa maka ihe isi ike so mwepụ ego mbelata mmanụ ụgbọala.

N’ozi a nke onyeisi otu a bụ Joe Ajaero binyereaka, o kwuru na gọọmentị etiti Naịjirịa na-achọ “itinye ndị mmadụ n’ọnọdụ ụbịa site na izuru ego n’aka ụmụafọ Naịjirịa ma were ya kwụọ ndị ọgaranya ụgwọ”.

Ozi NLC kwuru na kama gọọmentị ga-achọ ụzọ kwụọ ndị ọrụ ụgwọ maka ọrụ ha, ha a “na-aga n’ihu na-eso usoro ọchịchị aka ike”.

Ozi NLC kwuru:

“atụmatụ ịnye ndị a sị bụ ezịnaụlọ ndị ogbanye nde 12 ego N8000 ruo ọnwa isii bụ mkparị nye amamihe anyị nakwa ihe ịkwa emo nye ndidi na ezi agwa anyị na-enye gọọmentị”

Ozi ha gakwara n’ihu katọọ atụmatụ ndị ụlọomeiwu ibulie ego ụgwọ ọnwa ha ruo ijeri N70 nakwa ndị ikpe ruo ijeri N36 dịka ha kwuru na ya bụ atụmatụ “dịka mmadụ ihe ga-ama ụma metụta ndị ọ ma bụrụ ụzọ iji tinye ego ọha n’akpa bụ nke ndị ọchịchị kwesịrị ị na-echeba”.

Otu a kwukwara na atụmatụ ndị nwereike ịkpata ‘nzufu ego’ nakwa nrụrụaka nma ngalaba gọọmentị dị iche iche.

NLCCopyright: NLC

NLCCopyright: NLC

NLCCopyright: NLC

NLCCopyright: NLC

Article share tools

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *