Take a fresh look at your lifestyle.

 Tọọhapụ onye dibia bekee atọọrọ -NMA

Chigo dere ya n'Igbo.

0 305

Ndị otu ahụike Naịjirịa (NMA) akpọọla oku ka a tọhapụ otu n’ime ndị otu ha bụ Prof. Ekanem Ephraim, onye ndị  a na-amaghị ama tọọrọ n’ụlọ ya ụbọchị Tọzdee na Calabar. N’ajụjụ ọnụ ya na ndị nta akụkọ na Fraịde na Calabar, onyeisi NMA na Cross River, Dr Felix Archibong, kwuru na dọkịta a tọọrọ na-arụ ọrụ na Ụlọ Ọgwụ University nke Calabar Teaching (UCTH).

Archibong kwuru na ndị ntọọ a doziri onwe ha ka ndị ọrịa, gbakwụnye na ka Efraim na-ege  ha ntị, ha kpụpụtara ngwa ọgụ ma chụpụ ya n’ihe dị ka elekere 7.15 nke abalị.

. Ọ bụ ezie na a kọsara ndị uwe ojii ihe a, anyị chọrọ ka ndị ezi omume na Cross River, karịsịa gọvanọ, nyere anyị aka site n’ịhụ na a napụtara onye  out  anyị a tọọrọ .

Onye na-ahụ maka mgbasa ozi ọha na eze (PPRO), Cross River Command, DSP Irene Ugbo, kwuru  ihe a mere mgbe ndị ntaakụkọ kpọtụụrụ ya. Ugbo kwuru na ndị otu  ha a na-eso ndị a tọọrọ ka ha mara ebe e bugara onye ahụ.

“Ka anyị nwee ezi uche na ikpe ekpere  ka uwe ojii napụta ya n’aka ndị wakporo ya.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *