Take a fresh look at your lifestyle.

Ụlọikpe India ekpebiela na nwaanyị enweghị ọrụ nwere ikike iketa oke nhatanha n’aku di ya

0 415

Ụlọikpe dị na mba India enyela ụmụnwaanyị na-arụ naanị ọrụ ezinaụlọ ikike iketa oke nhatanha n’akụ dị ha.

N’ikpe nke Ụlọikpe Ukwu dị na Madras na Tamil Nadu steeti, India, kpebiri na nsonso a, ụlọikpe ahụ kwuru na “ọrụ nwaanyị na-arụ n’ụlọ dịka ịlekọta ezinaụlọ na ụmụaka na nke nwoke na-arụ ịkpata ihe ezinaụlọ ya na-eri pụtara na ” ha abụọ nwere nketa nhatanha n’ihe a kpatara n’ezinaụlọ ahụ.”

Mkpebi ahụ ihe pụtara ihe n’ikpe dị n’etiti di na nwunye lụrụ onwe ha n’afọ 1965 naTamil Nadu.

Nke nwoke hapụrụ India ga biri na Saudi Arabia ebe o nwetara ọrụ, ebe nwunye ya nọ n’ India na-elekọta ezinaụlọ ha.

Nwaanyị ahụ anaghị akpata ego kama o ji ego dị ya na-ezilata zụọ ọtụtụ ụlọ na ọla.

Oge di ya lọtara n’afọ 1994,o boro nwunye ya ebubo na ọ chọrọ ịkpakọrọ akụnaụba ya ma gbaa ya akwụkwọ n’ụlọikpe sị ka o nyeghachi ya akụnaụba( ụlọ anọ a zụrụ n’aha nwaanyị ahụ, ọla nakwa ihe onyinye ndị ọzọ o nyere ya dịka nwunye ya).

Nwoke ahụ sịrị na ọ bụ ya nyere nwaanyị ya ego o ji zụọ ihe ndị a ahụ nile, na ịhe nke a pụtara bụ na ya nyere ya ka o jidere ya ihe ndị ahụ nile.

Nwoke ahụ boro ebubo na nwaanyị ya zoro ọla ndị ahụ ma chọọ inyefe akụnaụba ndị ahụ nwoke ọzọ ya na ya na-ayị ka ọ na-elekọta.

N’afọ 2007, nwoke ahụ nwụrụ mana ụmụ ya gara n’ ihu n’ikpe ahụ.

N’abalị 21 nke ọnwa Juun afọ 2023, ụlọikpe kwubiri na nwunye nwoke ahụ “soro kpata akụ ahụ a na-azọ n’ihi na ọ na-arụ ọrụ ezinaụlọ nke nyere di ya ohere ịrụ ọrụ nke ya were kpata ego, na ya mere na akụ ọ kpara bụ ha abụọ nwe ya nhatanha”.

Ndị ọkacharamara n’iwu n ‘India kwuru na mkpebi ahụ ga-adị ire na nanị na steeti e kpebiri ya.

Ha kwuru na ọ ga-erua n’Ụlọikpe Kachasị na mba ahụ tupu mpaghara mba ahụ n’ile etinye n’ọrụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *