Take a fresh look at your lifestyle.

A nwụchiela ihe ruru mmadụ 150 na France maka ọgbaghara dapụtara ebe ahụ

0 504

N’ime abalị nke abụọ so ọgbaghara na-ada na France bụ nke dapụtara n’ihi egbe ndị uweojii gbara otu nwata nwoke onye ọkwọ ụgbọala dị afọ 17, ndị uweojii anwụchịela mmadụ 150 iji dajụọ ihe na-eme ahụ.

Ndị uweojii gbara nwata nwoke a nke aha ya bụ Nahel M egbe ebe ọ nọ ha nso ma jụ irubere iwu okporoụzọ isi.

N’obodo Nanterre bụ ebe a gbara Nahel egbe, ndị mmadụ ji iwe mụnye ụgbọala ndị uweojii ọkụ dịka ndị uweojii tụrụ gaasị anya mmiri akwa ebe ahụ iji chụsaa ndị mmadụ.

N’akụkụ Mons-en-Barœul nke Lille, ndị mmadụ wubara ama ọgbakọ nọ ebe ahụ wakpoo ya ma mụnye ya ọkụ.

Minista na-ahụ maka ihe na-eme n’ime obodo kọwara ihe a mere dịka ‘abalị nke ọtụtụ tigbuo zọgbuo dapụtara megide mba anyị”

Onyeisiala Emmanuel Macron sonyere ọgbakọ gbatagbata e hibere maka ihe a ma kwuo na ya bụ agwa “enweghi isi”.

Nahel bụ onye agbụrụ France na Algeria dịka otu onye siri gwaa ụlọ ntaakụkọ Reuters. Nnyocha ha gosiri na ndị na-anwụkarị n’aka ndị uweojii na mba ahụ na-abụkarị ndị isi ojii maọbụ ndị agbụrụ Arab.

Ụdịrị ihe dị etu a emebuola na mba ahụ n’afọ 2005 mgbe ọgbaghara so ngagharịiwe dapụtara na ihe mmadụ abụọ nwụrụ ebe ha na-agba ọsọ ka ha gbafuoro ndị uweojii.

 

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *