Take a fresh look at your lifestyle.

Tinubu, APC ga-amalite ịzara ọnụ ha n’ụlọikpe ntuliaka na Julaị 3

0 314

Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu na pati ya bụ ‘All Progressives Congress’ ga-amalite ịgọrọ ọnụ ha n’ụlọikpe mkpegharị maka okwu ntuliaka ọkwa onyeisiala nke 2023 n’ụbọchị atọ nke ọnwa Julaị.

N’ụbọchị Fraịde, Jun 23, ka ndị otu ‘Peoples Democratic Party’ na ‘Labour Party’ mechiri ikpe nke ha dịka ha na-ebo ebubo na Tinubu na APC emerịghị ntuliaka ahụ n’ezie n’agbanyeghị na Inec kpọpụtara ha dịka ndị meriri.

PDP na Atiku kpọrọ ndị akaebe 27 iji kwado ebubo ha, ebe Peter Obi na LP kpọrọ ndị akaebe 13, ma wetakwa ọtụtụ akwụkwọ iji gbaa akaebe.

Ọkaikpe Tinubu bụ Wole Olanipekun rịọrọ ndị ọkaikpe ka ha nyetụ ha ohere iji sonyere ndị ezinụlọ ha n’oge emume Sallah bụ nke ga-adị n’izuụka na-abịanụ.

O kwuru na ọ bụ eziokwu na etinyeburu ụbọchị 30 nke ọnwa Jun dịka ụbọchị APC kwesịrị ịmalite ịzara ọnụ ha, mana ọ ga-aka mma ka ụlọikpe yigharịa ya ka ọ bụrụzie mgbe emume Sallah gafechara.

“Anyị na-ekwe nkwa na anyị agaghị agafe ụbọchị ole e nyere anyị. Anyị ga-amalite ikpe anyị ma mechie ya n’ime otu izuụka,” Olanipekun kwuru.

Ndị ọkaikpe ise nọ n’isi ikpe ahụ, nke onyeisi ha bụ Harunna Tsammani, kwenyere ma yigharịa ụbọchị ikpe ahụ ka ọ bụrụ n’ụbọchị atọ nke Julaị 2023.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *