Take a fresh look at your lifestyle.

Ndị ndu Afrịka agaala Ukraine, Russia ịkpa maka udo

0 397

Ndị ọchịchị mba Afrịka dị icheiche anọrọla na mba Ukraine ugbua ebe ha ga-ezute onyeisiala mba ahụ bụ Volodymyr Zelensky, taa bụ Fraịde, Jun 16 2023, iji kpaa maka etu udo ga-esi lọghachi n’etiti ha na mba Russia.

Cyril Ramaphosa, onyeisiala mba Saut Afrịka, bụ onye ndu ndị otu a, bụ nke gụnyekwara onyeisiala mba Senegal, Macky Sall, onyeisiala mba Zambia Hakainde Hichilema, onyeisiala mba Comoros bụ Azali Assoumani bụkwa onyeisi oche otu African Union.

Ndị ọzọ gụnyere ụfọdụ ndị welitere isi na gọọmentị mba Egypt, Uganda na Congo; ha dị mmadụ asaa na-aga njem a.

N’ụbọchị Satọde, June 17, mmadụ asaa a ga-agakwa mba Russia ebe ha na onyeisiala Vladmir Putin ga-enwekwa mkparịtaụka.

Nke a na-abịa dịka akụkọ na-ekwu na ndị agha Ukraine amalitela ibuso ndị agha Russia agha dị egwu iji weghachite mpaghara ha dị icheiche bụ nke ndị agha Russia napụburu ha.

O dobeghị anya kpọmkwem ihe ọgbakọ a ga-abụ maka ya kpọmkwem, mana Ukraine na Russia so na mba abụọ Afrịka kacha azụ ‘wheat’ nakwa ‘fertilizer’ n’aka ha.

Kamgbe agha a malitere, Ukraine anaghị enweike ibupu ‘wheat’ ha gaa mba dị icheiche etu ha si emebu, nke a emetụtala ọnụahịa ihe oriri dị icheiche, ọ kachasị achịcha, na mba Afrịka dị icheiche tinyere Naịjirịa.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *