Take a fresh look at your lifestyle.

Adị m njikere mụ na ndị omeiwu ịrụkọ ọrụ – Onyeisiala Tinubu

0 318

Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Ahmed Tinubu ekeleela ndị ndu ụlọomeiwu eduru n’iyi ọrụ ma ṅụọ iyi na ya na ha ga-arụkọ ọrụ.

Tinubu kwuru nke a mgbe ọ na-agwa ndị omeiwu okwu dịka e duchara ha n’iyi ọrụ.

“A kpọọla anyị niile oku ịrụ ọrụ, anyị anabatala ife ala nna anyị site n’iyi anyị ṅụrụ. Ugbua bụ oge bụ oge dịịrị anyị ịmalite ọrụ ozugbo na-egbughi oge.

“Dịka onyeisiala, adị m njikere mụ na ndị omeiwu ịrụkọ ọrụ. Ndị Naịjirịa na-atụ anyị na ndị omeiwu ga-eme iwu ga-eme ka ọchịchị gọọmenti dị na-aga nke ọma nke ga-emetụta ndụ ndị mmadụ.”

Aga m achọ ka onye ọbụla tinye uchu n’ọrụ dịka unu tinyere n’oge ntuliaka iji merie.”

Cheta na ntuliaka e mere n’ụlọomeiwu na Tuzde, a họpụtara Godswill Akpabio dịka onyeisi ụlọomeiwu ukwu ebe Jibirl Barau, Tajudeen Abbas dịka onyeisi ụlọomeiwu nta ebe Benjamin Kalu na-esote ya.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *