Take a fresh look at your lifestyle.

O nweghị mgbe gọvanọ Abia steeti jiri kwuo na ọ gaghị akwụ ndị Abia ụgwọ ọnwa Epreel

0 268

Kazie Uko bụ ọnụ na-ekwuchitere Gọvanọ Abia steeti sị na akụkọ na gọvanọ Alex Otii agaghị akwụ ndị ọrụ gọọmenti Abia ụgwọ ọnwa Epreel bụ nnukwute asị.

Cheta na akụkọ malitere fegharịwa na gọvanọ Abia steeti sị na ọ gaghị akwụ ndị ọrụ gọọmenti Abia ụgwọ ọnwa Epreel n’izua, mana nke nke nnyocha ndi ntaakuo mere maka ya bụ akụkọ hụrụ na nke a bụ asị.

Cheta na Alex Otii bụ gọvanọ Abia steeti kwuru na ọ ga na-akwụ ndị ọrụ gọọmenti ụgwọ ọnwa n’ụbọchị iri abuo na asaato  kwa ọnwa, ma sịkwa na ha ga-enyocha ma ndị niile kpọrọ onwe ha ndị ọrụ gọọmenti ha bụ ya n’ezie.

Maazị Uko sị na akụkọ a nwereike isi n’ọnụ ndị ọchịchị Otii amasịghị.

Ha sị na ha na-agba mbọ niile ịhụ na ihe niile ga-agata nke ọma na steeti.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *