Take a fresh look at your lifestyle.

Etu ndị ntorobịa obodo Ichi si gbaa ogige ndị ekperịma ọkụ

0 626

Akụkọ dapụtara na soshal midia taa bụ ụbọchị Sọnde abali iri nke ọnwa Eprel,afọ 2022 kọwara etu ndị ntorobịa n’obodo Ojoto nakwa obodo Ichi dị n’okpuruọchịchị Ekwusigo nke Anambra steeti si nyochapụta ma menyụọ ndị a na-enyo na-etinye aka na mwakpo na ntọrọ ndị mmadụ ebe ahụ anya.

Otu nwoke bi ebe ahụ na-achọghị ka a kpọ aha ya gwara BBC Igbo etu ya bụ atụmatụ si malite.

O kwuru na ndị obodo ha anabataghị ọnọdụ ihe ọjọọ nakwa enweghị nchekwa na-akawanye njọ n’akụkụ Anambra steeti ịche ịche nke mere ndị obodo agbataobi ha bụ obodo Ojoto ji nwụchịe ndị a a na-enyo n’okwu igbu ndị mmadụ, ịtọ ndị mmadụ nakwa mwakpo.

N’okwu ya, ọ sị:

“N’ụbọchị Satọde ka ndị obodo Ojoto nyochapụtara ndị a na-enyo na-akpa nkata mwakpo n’obodo ahụ ma nyochapụtakwa ebe a sị ha na-ezo n’akụkụ ogige ‘mmiri john’’

O kwuru: “Ndị ntorobịa gbakọtara wụbanye ebe ahụ ma nwudo mmadụ abụọ n’ime ha, tie ha ihe tupu ha agba ama ọrụ ọjọọ ha na-arụ”

Nwoke a na-achọghị ka akpọ aha ya kọwara etu ndị a si na-atọ ndị mmadụ aghara aghara ma na-ana ndi ezinụlọ ha ego mgbapụta na nso nso a.

O kwuru:

“Ndị a kwupụtara etu ha si gbuo ndị mmadụ n’oge gara aga, ndị obodo anyị ma tọrọ ndị ọzọ”

“Ha gbara ama na ọ bụ nwoke dịbịa a kpọrọ ‘Odogwu’ bụ ihe na-agwọrọ ha ọgwụ ha ji echekwa onwe ha ma na-akpa ike”

“Ndị ntorobịa gbakọtara jide onye dịbịa ahụ n’ụbọchị Satọde”

Kedụ onye bụ Odogwo a?

Ka onye a si gbara ndi nta akuko Igbo ama, Odogwo bụ onye Dịbịa a sị na-agwọrọ ndị a na-enyo na-arụ ọrụ ndị ekperịma ebe ahụ ọgwụ.

O kwuru na ya bụ nwoke onye dịbịa abụghị onye obodo Ichi mana o si n’ụzọ aghụghọ nwete ala ebe ọrụrụ ụlọ n’obodo ahụ.

E kwukwara na ya bụ nwoke bụ onye na-ezoro ndị a a na-ebo ebubo ịkpa mkpamkpa egbe. na ngwa agha ha ndị ọzọ.

Nwoke a kwuru na ọ bụ onye obodo Ụmụnze.

Ka nwoke a sị kwuo:

“N’ụtụtụ Sọnde a, a natara m ozi etu ndị ntorobịa si wụbanye be onye dịbịa a na-enyo maka ebubo ịgwọrọ ndị ekperịma ọgwụ bi, ma malite ịgba ya ọkụ”

“Ihe na-eme n’obodo Ichi”

“Ha gbara be ya ọkụ ma mụnye ụgbọala ya ọkụ”

O kwuru na ihe kpalịtere mmụọ ndị ntorobịa ime nke a bụ etu ha sị chọọ idokwa udo n’obodo ha

“Ndị Ojoto bụ ihe nwụdoro ndị a a na-enyo n’okwu a, a na atụ anya na ha ga-enyefe ha n’aka ndị uweojii”

Ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia gosiri ihe ndị a nwoke kwuru n’ezie.

Nke a na-abịa dịka gọọmentị steeti zipụtara ozi n’ụbọchị Satọde ma rịọ ndị Anambra ka ha tikọ aka ọnụ kwụsị ndị ekperịma na-akpa ike ebe ahụ ịrụ ọrụ ọjọọ ha.

Ozi a gọọmentị steeti ahụ zipụtara kọwara etu ndị omekome si ana ndị mmadụ ụtụisi tupu ha echie echichi, gba akwụkwọ nakwa mmeme ndị ọzọ.

N’ozi a, gọọmentị kwuru: “Ndị ekperịma a na-ana ndị mmadụ ụtụisi, na-amaja ndị mmadụ ma na-ana ego ụtụisi n’akụkụ Ihiala, Nnewi South nakwa Aguata “

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *